Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 21:10 - Bible Nso

10 Rizpa nwa-nwayi Aia we chiri ákwà-nkpe, b͕asara onwe-ya n'elu oké nkume, site na nmalite owuwe-ihe-ubi rue mb͕e esi n'elu-igwe wukwasi ha miri-ozuzo; o kweghi kwa ka anu-ufe nke elu-igwe nọkwasi ha n'ehihie, ma-ọbu anu-ọhia n'abali.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Ma Rizpa, nwa nwanyị Aịa were akwa mkpe gbasara onwe ya nʼelu nkume. O kweghịkwa ka anụ ufe bekwasị ha nʼehihie, maọbụ anụ ọhịa nʼabalị. Ọ nọgidere nʼebe ahụ site nʼoge mmalite owuwe ihe ubi tutu ruo mgbe mmiri bidoro izokwasị anụ ahụ ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 21:10
19 Iomraidhean Croise  

ọ fọduru ubọchi atọ Fero gēweli isi-gi wepu ya n'aru gi, kwuba gi n'elu osisi; anu-ufe gēri kwa anu-aru-gi site n'aru gi.


Ewe gosi Devid ihe Rizpa nwa Aia, nwayi bu iko Sọl, mere.


Ma Sọl nwere iko-nwayi, aha-ya bu Rizpa, nwa-nwayi Aia. Ish-boshet we si Abnea, Gini mere i bakuru iko-nwayi nnam?


O rue, mb͕e Ehab nuru okwu ndia, na ọ dọwara uwe-ya nile, tukwasi ákwà-nkpe n'anu-aru-ya, bue ọnu, dina n'ákwà-nkpe, jegharia nwayọ.


Ọ̀ di ihe ọ bula n'etiti ihe-efu nile nke mba nile nke nēme ka miri zo? ma-ọbu elu-igwe, hà gēnye oké miri-ozuzo? ọ̀ bughi Gi onwe-gi bu Onye ahu, Jehova, bú Chineke-ayi? ayi gēle kwa anya Gi; n'ihi na Gi onwe-gi emewo ihe ndia nile.


N'elu ugwu nile nke Israel ka i gāda, gi onwe-gi, na usu-ndi-agha-gi nile, na ndi di iche iche ndi nēso gi: udele nile di iche iche na anu ọhia ka M'gēwere gi nye, ka ha we rie gi.


Ka ayi mara kwa, ka ayi b͕aso imara Jehova; dika chi-ọbubọ, otú a ka ọpupu-Ya guzosiworo ike: Ọ gābiakute kwa ayi dika oké miri-ozuzo, dika miri-ozuzo ikpe-azu nke nēzosa ala.


Le otú anu-ulo ezewo ume nke-uku! ọ nāb͕a ìgwè ehi nile ghari, n'ihi na ọ dighi nri-ọtita ha nwere; e, ìgwè ewu na aturu nile ahuwo ahuhu ikpe-ọmuma.


Umu Zaion, teghari-kwa-nu egwú ọṅù, ṅuri kwa na Jehova, bú Chineke-unu: n'ihi na Ọ nēnye unu miri-ozuzo mbu ka ezi omume-Ya si di, me kwa ka oké miri-ozuzo zodatara unu, bú miri-ozuzo mbu na miri-ozuzo ikpe-azu, n'ọnwa mbu.


Riọnu Jehova miri-ozuzo n'oge miri-ozuzo nke-ikpe-azu, ọbuná Jehova Nke nēme àmùmà; ọ bu kwa oké miri-ozuzo ka Ọ gēnye ha, nye onye ọ bula ihe-ọkukù n'ubi-ya.


na m'gēnye miri-ozuzo ala-unu na mb͕e-ya, miri-ozuzo mbu na miri-ozuzo ikpe-azu, ka i we chikọta ọka-gi, na manya-vine ọhu gi, na manu-gi.


yipu uwe ndọta-n'agha-ya n'aru ya, nọdu n'ulo-gi, kwara nna-ya na nne-ya ogologo otù ọnwa: emesia i gābakuru ya, we ghọrọ ya di, ọ we ghọrọ gi nwunye.


Mb͕e nmehie di n'onye ọ bula, bú ihe eji ma ya ikpe ọnwu, ewe me ka ọ nwua, i we kwuba ya n'osisi;


ozu-ya agaghi-adigide n'elu osisi abali nile, kama i ghaghi ilì ya n'ubọchi ahu; n'ihi na ihe-nkọcha nke Chineke ka onye a kwugburu akwugbu bu; ka i ghara imeru ala-gi, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ka ọ buru ihe-nketa.


Onye Filistia ahu we si Devid, Biakutem, ka m'were kwa anu-aru-gi nye anu-ufe nke elu-igwe na anumanu nke ọhia.


Ubọchi ta ka Jehova gēmechibido gi nye n'akam; m'gētib͕u kwa gi, wezuga isi-gi n'aru gi; m'gēwere kwa ozu ndi ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia nye anu-ufe nke elu-igwe, nye kwa anu-ọhia nke uwa ta; ka uwa nile we mara na Chineke diri Israel:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan