Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 20:6 - Bible Nso

6 Devid we si Abishai, Ub͕u a Sheba nwa Bikri gēmejọ ayi kari Absalom: gi onwe-gi chiri ndi-orù onye-mwe-gi, chua ya n'azu, ka o we ghara ichọtara onwe-ya obodo ufọdu ewusiri ike, we naputa onwe-ya n'anya-ayi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Devid sịrị Abishai, “Lee nwoke a bụ Sheba nwa Bikri na-aga ime ihe ọjọọ ga-adị njọ karịa nke Absalọm mere. Chịrị ndị agha nna gị ukwu chụso ya, ma ọ bụghị ya, ọ ga-achọta obodo e wusiri ike gbaba, ebe anyị na-apụghị inweta ya.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 20:6
17 Iomraidhean Croise  

Umu Amon we hu na Siria ab͕alagawo, ha onwe-ha we b͕alaga kwa n'iru Abishai, ba n'obodo. Joab we si n'ebe umu Amon nọ lata, biarue Jerusalem.


Uraia we si Devid, Ib͕e Chineke, na Israel, na Juda, nānọdu n'ulo-ntu; onye-nwem Joab na ndi-orù onye-nwem nānọ kwa n'ulo-ikwū n'ọhia; ma mu onwem, m'gābà n'ulom, iri ihe na iṅu ihe-ọṅuṅu, na isoro nwunyem dina? ndu-gi, na ndu nkpuru-obi-gi, ma ọ buru na emem ihe a.


Nwoke ahu we si Joab, Ọ buru kwa na mu onwem ejide n'ọbu-akam nnù ọla-ọcha abua na ọgu iri, ma m'gaghi-eseti akam imegide nwa eze: n'ihi na ọ bu na nti-ayi ka eze nyere gi na Abishai na Itai iwu, si, Lezienu anya bayere nwa-okorọbia ahu, bú Absalom, onye ọ bula.


Devid we zipu ndi ahu, otù uzọ n'uzọ atọ n'aka Joab, na otù uzọ n'uzọ atọ n'aka Abishai nwa Zeruaia, nwa-nne Joab, na otù uzọ n'uzọ atọ n'aka Itai, bú onye Gat Eze we si ndi-ya, Aghaghm iso unu pua, ọbuná mu onwem.


Ma ub͕u a bilie, pua, gwa ndi-orù-gi okwu gāba ha n'obi: n'ihi na aṅuwom iyi na Jehova, na ọ dighi otù nwoke gēsoro gi nọ ọnọdu abali a, ma asi na i gaghi-apu: ma nke ahu gājọrọ gi njọ kari ihe ọjọ nile nke biakwasiworo gi site ka i di na nwata rue ub͕u a.


Umu-ndikom Zeruaia atọ nọ kwa n'ebe ahu, bú Joab, na Abishai, na Asahel: ma ukwu Asahel di nfe n'ib͕a ọsọ dika otù nime mb͕ada nke di n'ọhia.


Ma Abishai nwa Zeruaia yere ya aka, tib͕ue onye Filistia ahu, me ka ọ nwua. Mb͕e ahu ndikom Devid ṅuru ya iyi, si, I gaghi eso ayi pua ibu agha ọzọ, ka i ghara imenyu oriọna Israel.


Ma Abishai, bú nwa-nne Joab, nwa Zeruaia, onye ahu bu onye-isi ndikom atọ ahu. Onye ahu feghari-kwa-ra ube-ya imegide ọgu ndikom iri-na-ise, ha we ghọ ndi eb͕uru eb͕u, o we nwe aha n'etiti ndikom atọ ahu.


Ma Joab na Abishai, bú nwa-nne-ya, b͕uru Abnea, n'ihi na o mere ka nwa-nne-ha, bú Asahel, nwua nime Gibeon n'agha ahu.


Ma mu onwem akaghi aru ta, ọ bu ezie na abum onye etere manu ibu eze; ndikom ndia, bú umu Zeruaia, di kwa ike karim: Jehova kwughachi onye nēme ihe ọjọ dika ihe ọjọ ya si di.


Eze we si ha, Chirinu ndi-orù onye-nwe-unu tiyere onwe-unu, me ka Solomon, bú nwam, nọkwasi n'inyinya mule nke m'nwere, me-kwa-nu ka ọ ridarue Gaihon:


Ma Abishai, bú nwa-nne Joab, onye ahu bu onye-isi ndikom atọ ahu: onye ahu feghari-kwa-ra ube-ya imegide ọgu ndikom iri-na-ise, ha we ghọ ndi eb͕uru eb͕u, o we nwe aha n'etiti ndikom atọ ahu.


Abishai nwa Zeruaia tib͕u-kwa-ra Edom nime Ndagwurugwu Nnù. orú nnù ndikom uzọ abua na nnù ise.


N'ìhi gini ka ayi onwe-ayi nānọdu ala? chikọtanu onwe-unu, ka ayi ba n'obodo nile ewusiri ike, we debe ọnu-ayi du n'ebe ahu: n'ihi na Jehova, bù Chineke-ayi, emewo ka ayi debe ọnu-ayi du, O mewo kwa ka ayi ṅua miri ńsí, n'ihi na ayi emehiewo megide Jehova.


Ọzọ, ọ buru na ala-eze ekewa megide onwe-ya, ala-eze ahu apughi iguzo.


Devid we za, si Ahimelek, bú onye Het, si kwa Abishai nwa Zeruaia, bú nwa-nne Joab, si, Ònye gēsorom ridakuru Sọl, rue ọmuma-ulo-ikwū? Abishai we si, Mu onwem gēsoro gi rida.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan