Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 20:19 - Bible Nso

19 Mu onwem bu otù onye nime ndi-udo ndi kwesiri ntukwasi-obi n'Israel: gi onwe-gi nāchọ ime ka otù obodo na otù nne n'Israel nwua: n'ìhi gini ka i gēloda ihe-nketa Jehova?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 Anyị bụ ndị udo na ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼIzrel. I na-achọ ibibi obodo bụ nne nʼIzrel. Gịnị mere i ji chọọ iloda ihe nketa nke Onyenwe anyị?”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 20:19
29 Iomraidhean Croise  

Abraham we biarue nso, si, Ọ̀ gābu ezie na I gēkpochapu ndi ezi omume tinyere ndi nēmebi iwu?


N'ihi na eze gānu, inaputa orù-ya nwayi n'ọbu-aka nwoke nāchọ ikpochapu mu na nwam nwoke n'otù n'ihe-nketa Chineke.


Ma ub͕u a ziganu ngwa ngwa, gosi Devid, si, Anọla ọnọdu abali a n'ala ihe nādighi nke ọzara, kama i ghaghi igabiga; ka aghara iloda eze na ndi nile ndi ya na ha nọ.


Nwayi ahu we kwue, si, Ha nēkwu ekwu na mbu, si, Ha aghaghi iju ase n'Ebel: otú a ka ha kwuzu-kwa-ra okwu.


Joab we za, si, Ya burum ihe-árú, ya burum ihe-árú; m'gaghi-eloda ma-ọli, m'gaghi-ebibi kwa ma-ọli.


Devid we si ndi Gibeon, Gini ka m'gēmere unu? gini kwa ka m'gēji kpuchie nmehie, ka unu we gọzie ihe-nketa Jehova?


N'ihi na Gi onwe-gi kewaputara ha n'etiti ndi nile nke uwa, iburu Gi ihe-nketa, dika I kwuru n'aka Moses, bú orù-Gi, mb͕e I mere ka nna-ayi-hà si n'Ijipt puta, Onye-nwe-ayi, bú Jehova.


Ka m'we lekwasi ọdi-nma nke ndi I rọputaworo, Ka m'we ṅuria n'ọṅù mba-Gi, Ka m'we soro ihe-nketa-Gi nya isi.


Mb͕e ahu ha gēlowori ayi na ndu, Mb͕e iwe-ha di ọku n'aru ayi:


Mba ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú mba ahu nke Jehova bu Chineke-ya; Bú ndi ahu Ọ rọputara iburu Ya ihe-nketa.


O mere ka o si n'iso nne-aturu nke nēnye umu-ha ara bia, Izù Jekob, bú ndi-Ya, na Israel, bú ihe-nketa-Ya, dika aturu.


Nebukadreza, bú eze Babilon, eripiawom, o kpochapuwom, o mewom ka m'ghọ aria nke ihe nādighi, o lowom dika ogologo anu-miri, o mejuwo afọ-ya n'ihe-utọm nile, ọ chupuwom.


M'gēji kwa nmehie-ya leta Bel nime Babilon, M'gēme kwa ka ihe o loworo si n'ọnu-ya puta; mba di iche iche agaghi-erùkuru kwa ya ọzọ dika miri: ọzọ mb͕idi Babilon gāda.


Ndi-iro-gi nile asaghepuwo ọnu-ha imegide gi; Ha amawo ọsọ̀, ta ikekere-ezé; ha asiwo, Ayi elodawo ya; N'ezie nka bu ubọchi ahu nke ayi lere anya ya; ayi achọtawo, ayi ahuwo.


Onye-nwe-ayi elowo ebe-obibi nile nke Jekob, ghara inwe ọmiko n'aru ha; Ọ kwadawo ebe nile ewusiri ike nke ada Juda nime nrubiga-ókè nke iwe-Ya: O tidaruwo ha ala: O mewo ala-eze na ndi-isi-ya ka ha ghara idi nsọ.


Onye-nwe-ayi adiwo ka onye-iro, Ọ lodawo Israel; O lodawo ulo-elu-ya nile, O bibiwo ebe-Ya nile ewusiri ike: O me ka ize-ume na isu-ude ba uba n'ada Juda.


ala we saghe ọnu-ya, loda ha, na ulo nile ha, na madu nile Kora nwere, na àkù-ha nile.


ala we saghe ọnu-ya, loda ha na Kora, mb͕e nzukọ ahu nwuru; mb͕e ọku ahu ripiara ọgu ndikom iri-na-abua na iri ahu, ha we ghọ ihe-iriba-ama.


Ma mb͕e ọ bula aru a nke puru ire uré gēyikwasiwori ereghi-uré, mb͕e aru a nke puru inwu anwu gēyikwasiwori anwughi-anwu kwa, mb͕e ahu okwu ahu edeworo n'akwukwọ nsọ gēme, bú, Eloro ọnwu rue nmeri.


N'ihi na ayi, bú ndi nọ n'ulo-ikwū a, ayi nāsu udè ezie, ebe ọ nānyib͕u ayi; n'ihi na ayi achọghi ka eyipu ayi ya, kama ka eyikwasi ayi ihe n'elu ya, ka ndu we loda ihe puru inwu anwu.


Mb͕e i nābiaru nso obodo ibuso ya agha, i gākpọ kwa ya òkù udo.


N'ihi na òkè Jehova bu ndi-Ya; Jekob bu akuku ihe-nketa-Ya.


n'ihi ndi-eze na ndi nile nọ n'ọnọdu di elu; ka ayi we biri obi udo na nke di nwayọ nime nsọpuru-Chineke nile na ikwesi-nsọpuru nile.


Obodo ntà we ghara idi n'Israel, ha we ghara idi, Rue mb͕e mu, bú Debora, biliri, Rue mb͕e mu, bú nne n'Israel, biliri.


Samuel we were karama manu, wukwasi ya n'isi-ya, sutu ya ọnu, si, Ọ̀ bughi na Jehova etewo gi manu ibu onye-ndú ihe-nketa-Ya?


Ma ub͕u a, biko, ka onye-nwem, bú eze, nuru okwu nile nke orù-ya. Ọ buru na Jehova arafuwo gi imegidem, Ya nu ísì utọ nke onyinye-inata-iru-ọma: ma ọ buru umu madu, ndi anābu ọnu ka ha bu n'iru Jehova; n'ihi na ha achupuwom ta n'irapara n'aru ihe-nketa Jehova, si, Je, fè chi ọzọ òfùfè.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan