Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 20:10 - Bible Nso

10 Ma Amasa elezighi anya na mma-agha nke di n'aka Joab: o we were ya tie ya n'okpuru ọgiriga nke-ise, wusi ngiri-afọ-ya n'ala, ma o tighi kwa ya ọzọ; o we nwua. Joab na Abishai, bú nwa-nne-ya, we chua Sheba nwa Bikri n'azu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Amasa elezighị anya hụ na mma agha nta dị nʼaka Joab. Joab mabanyere ya nʼime afọ Amasa, mee ka mgbịrị afọ ya sọsikwaa nʼala. Ọ maghị ya mma ahụ ugboro abụọ, nʼihi na otu ugboro ahụ mere ka Amasa nwụọ. Mgbe ahụ, Joab na nwanne ya Abishai chụsoro Sheba nwa Bikri nʼazụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 20:10
13 Iomraidhean Croise  

Ken we si Ebel, bú nwa-nne-ya, Ka ayi je n'ọhia. O rue, mb͕e ha nọ n'ọhia, na Ken biliri imegide Ebel, bú nwa-nne-ya, we b͕ue ya.


Ma ọ juru iwezuga onwe-ya: Abnea we were isi ube-ya tie ya n'okpuru ọgiriga-ya nke-ise, ube we puta n'azu ya, o we da n'ebe ahu, nwua n'okpuru ya: o rue, na ndi nile ndi biaruru ebe ahu, bú ebe Asahel dara nwua, guzoro.


Joab we si Amasa, Ọ̀ bu n'udo ka i nọ, nwa-nnem? Joab we were aka-nri-ya jide Amasa n'afu-ọnu isutu ya ọnu.


Abnea we laghachi rue Hebron, Joab we wezuga ya n'etiti ọnu-uzọ-ama ikpayere ya uka na nwayọ, o we tie ya n'okpuru ọgiriga-ya nke-ise n'ebe ahu, o we nwua n'ihi ọbara Asahel, bú nwa-nne-ya.


Ha nāchi uta, nēme aka-nri nēme kwa aka-ekpe n'itu nkume na n'iwere uta b͕a àkú; ha sitere n'umu-nne Sọl site na Benjamin.


Ishmael nwa Netanaia we bilie, ya na ndikom iri ahu ndi ya na ha yikọrọ bia, ha we were mma-agha tib͕ue Gedalaia nwa Ahaikam, nwa Shefan, we me ka ọ nwua, bú onye eze Babilon mere onye-nlekọta ala ahu.


Ọ buru kwa na ọ kwatue ya n'ikpọ-asì, ma-ọbu tua ya ihe, mb͕e o nēche anwu, o we nwua;


Umu Israel we tikue Jehova, Jehova we me ka onye-nzọputa biliere ha, bú Ihud nwa Gira, onye Benjamin, onye nēme aka-ekpe: umu Israel we si n'aka-ya zigara Eglon eze Moab onyinye-inata-iru-ọma.


Ihud we setipu aka-ekpe-ya, si n'apata-ukwu aka-nri ya were mma-agha ahu, ma ya n'afọ-ya:


Abishai we si Devid, Chineke emechibidowo onye-iro-gi nye n'aka-gi ta: ma ub͕u a, biko, ka m'were ube tugide ya n'ala otù ub͕ò, m'gaghi-atu kwa ya nke ub͕ò abua.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan