Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 20:1 - Bible Nso

1 Ma ọ dabatara otù nwoke jọb͕uru onwe-ya inọ n'ebe ahu, aha-ya bu Sheba, nwa Bikri, onye Benjamin: o we fùa opì-ike, si, Ayi enweghi òkè nime Devid, ayi enweghi kwa ihe-nketa nime nwa Jesi: nwoke ọ bula, ya la n'ulo-ikwū-ya, Israel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Mgbe ahụ, otu onye okwu na ụka, aha ya bụ Sheba, nwa Bikri, onye Benjamin nọ nʼebe ahụ nʼoge a. Ọ fụrụ opi ike ya tie mkpu sị, “Anyị enweghị oke nʼime Devid, anyị enwekwaghị ihe nketa nʼime nwa Jesi. Ndị Izrel, onye ọbụla laa nʼụlọ ikwu ya!”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 20:1
31 Iomraidhean Croise  

Umu-ndikom Benjamin; Bela na Beka, na Ashbil, na Gira, na Neaman, na Ihi, na Rosh, na Mupim, na Hupim, na Ad.


Absalom we ziga ndi-nledo n'ebo nile nke Israel, si, Mb͕e unu nuru olu opì-ike, unu gāsi kwa, Absalom bu eze na Hebron.


Devid we si Abishai, si kwa ndi-orù-ya nile, Le nwam, nke siri n'afọm puta, nāchọ ndum: onye Benjamin nka, ò gēsi kwa aṅa ghara ichọkari ya ub͕u a? ka ọ nọduru onwe-ya, ka ọ kọcha kwa; n'ihi na Jehova siworo ya, Kọcha.


Ma otú a ka Shimai siri mb͕e ọ nākọcha, Pua, pua, gi nwoke ọbara na nwoke jọb͕uru onwe-ya:


Ha we were Absalom, tubà ya n'olùlù uku n'oké ọhia ahu, me ka oké obo uku nke nkume guzo n'elu ya: Israel nile we b͕alaga, onye ọ bula n'ulo-ikwū-ya


Ndikom nile nke Israel we si n'iso Devid rigo, so Sheba nwa Bikri: ma ndikom Juda rapara n'aru eze-ha, site na Jọdan we rue Jerusalem.


Nwayi ahu we biakute ndi obodo ahu nile n'amam-ihe-ya. Ha we bipu isi Sheba nwa Bikri, tupuru ya Joab. O we fùa opì-ike, ha we si n'obodo ahu b͕asa, nwoke ọ bula ọ la n'ulo-ikwū-ya. Joab we lata na Jerusalem jekuru eze.


Ma ndi jọb͕uru onwe-ha di ka ogwu anēkopu ekopu, ha nile, N'ihi na ọ bughi aka ka eji ewere ha:


Israel nile we hu na eze egeghi ha nti, ndi Israel we weghachiri eze okwu, si, Òkè gini ka ayi nwere nime Devid? ọ dighi kwa ihe-nketa di nime nwa Jese: lanu n'ulo-ikwū-unu, Israel: ub͕u a le ulo-gi, Devid. Israel we la n'ulo-ikwū-ha.


me-kwa-nu ka ndikom abua, bú ndi jọb͕uru onwe-ha, nọdu n'iru ya, ka ha b͕a kwa àmà megide ya, si, I b͕akutere Chineke na eze azu. Me-kwa-nu ka ọ pua, werenu nkume tub͕ue ya, ka ọ nwua.


Israel nile we hu na eze egeghi ha nti, ndi Israel we weghachiri eze okwu, si, Òkè gini ka ayi nwere nime Devid? ọ dighi kwa ihe-nketa di nime nwa Jesi: lanu, nwoke ọ bula, n'ulo-ikwū-unu, Israel: ub͕u a le ulo-gi, Devid. Israel nile we la n'ulo-ikwū-ha.


Eze, bú Rehoboam, we me ka ndi-okenye dua ya ọdu, bú ndi nēguzo n'iru Solomon nna-ya mb͕e ọ nọ na ndu, si, Ùnu onwe-unu si aṅa nādu ọdu iweghachiri ndi nka okwu?


Bilie, Jehova, Buru ya uzọ, me ka o ruru ala: Me ka nkpuru-obim b͕apu n'aka ndi nēmebi iwu site na mma-agha-Gi;


Ha di ọtutu, bú ihe ọjọ nke nādakwasi onye ezi omume: Ma n'aka ha nile ka Jehova nānaputa ya.


Apula ngwa ngwa ise okwu, Ka o we ghara ibu na i maghi ihe i gēme n'ikpe-azu-ya, Mb͕e madu-ibe-gi etiyewo gi n'ọnọdu-ihere.


Dika icheku si di n'ebe icheku nēre ọku di, na dika nkú si di n'ebe ọku di; Otú a ka onye nēse okwu di ime ka ilu-ọ̀gù nwuru ọku.


Ọzọ, ọ buru na ala-eze ekewa megide onwe-ya, ala-eze ahu apughi iguzo.


Ma ndi-obodo-ya kpọrọ ya asì, ha we zìe ndi-ozi ga n'azu ya, si, Ayi achọghi ka nwoke a buru eze-ayi.


Otú ọ di, ndi-irom ndia, ndi nāchọghi ka m'buru eze-ha, kuta ha n'ebe a, b͕ue ha n'irum.


Pita si Ya, I gaghi-asa ukwum ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi. Jisus zara ya, si, Ọ buru na asaghm i, Mu na gi enweghi òkè ọ bula.


Ndikom ufọdu, ndi jọb͕uru onwe-ha, esiwo n'etiti gi pua, we duhie ndi bi n'obodo-ha, si, Ka ayi je fè chi ọzọ òfùfè, (nke ọ nādighi mb͕e unu mara ha);


Mb͕e ha onwe-ha nēme ka obi-ha di nma, le, ndikom obodo ahu, bú ndikom jọb͕uru onwe-ha, b͕ara ulo ahu buruburu, nētisi aka ike n'ọnu-uzọ; ha we gwa onye-nwe ulo ahu okwu, bú agadi nwoke ahu, si, Me ka ọ puta, bú nwoke nke bara n'ulo-gi, ka ayi we mara ya.


O rue, mb͕e ọ biara, na ọ fùru opì-ike n'ugwu Efraim, umu Israel we si n'ugwu ahu soro ya rida, ya onwe-ya we nọ n'iru ha.


O we je, ba n>ubi, chikọta ihe n>ubi ahu n>azu ndi n=eb#i ọka: o we dabara ya ib#a n>#ok#e ubi Boaz nwere, onye sitere n>ab͕uru Elimelek.


Sọl we rọputara onwe-ya nnù ndikom asa na ọgu iri sitere n'Israel; nnù ndikom ise we di n'aka Sọl nime Mikmash na n'ugwu Bet-el, nnù ndikom abua na ọgu iri di kwa n'aka Jonatan nime Gibea Benjamin: ma o zilagara ndi fọduru n'etiti ndi Israel, onye ọ bula n'ulo-ikwū-ya.


Ma umu-ndikom Ilai bu ndi jọb͕uru onwe-ha; ha amaghi Jehova.


Ndikom ọjọ nile na ndi jọb͕uru onwe-ha, n'etiti ndi soro Devid je, we za, si, N'ihi na ha esoghi ayi je, ayi agaghi-enye kwa ha ihe ọ bula nime ihe-nkwata nke ayi naputara, ma-ọbughi inye nwoke ọ bula nwunye-ya na umu-ya, ka ha we duru ha, la.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan