Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 2:27 - Bible Nso

27 Joab we si, Chineke nādi ndu, ọ buru na i kwughi, n'ezie mb͕e ahu site n'ututu ndim gārigowori, nwoke ọ bula site n'iso nwa-nne-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

27 Joab zara sị, “Eji m aha Chineke ṅụọ iyi na-asị na ọ bụrụ na i gbara nkịtị, ndị a gaara achụso ụmụnna ha ọsọ na-akwụsịghị ruo nʼụtụtụ echi.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 2:27
11 Iomraidhean Croise  

Abnea we si Joab, Biko, ka umu-okorọbia bilie, me ihe-ọchì n'iru ayi. Joab we si, Ka ha bilie.


Abnea we kpọ Joab òkù, si, Ọ̀ bu rue mb͕e ebighi-ebi ka mma-agha gēripia? ì maghi na ilu ka ọ gādi n'ikpe-azu? rù kwa ole mb͕e ka i nāgaghi-asi ndi-gi ka ha si n'iso umu-nne-ha laghachi?


Joab we fùa opì-ike, ndi-ya nile we guzo, ha achughi kwa Israel n'azu ọzọ, ha ebughi kwa agha ọzọ.


Chineke nādi ndu, Onye wezugara ikpém; Onye puru ime ihe nile nādi kwa ndu, bú Onye mere ka nkpuru-obim di ilu;


Ọziza-okwu di nrò nēme ka ọnuma laghachi azu: Ma okwu nwuta nākpali iwe.


Dika mb͕e madu nērùpu miri, otú a ka isi-nmalite ise-okwu di: N'ihi ya tutu ilu-ọ̀gù esie ike rapu ya.


Èchìchè nile nēji ndum-ọdu guzosi ike: Gi were kwa ezi ndum-ọdu bue agha.


Apula ngwa ngwa ise okwu, Ka o we ghara ibu na i maghi ihe i gēme n'ikpe-azu-ya, Mb͕e madu-ibe-gi etiyewo gi n'ọnọdu-ihere.


I we si, Rue mb͕e ebighi-ebi ka m'gabu nwanyi-nwenu: i we ghara itukwasi ihe ndia n'obi-gi, i chetaghi ikpe-azu-ya.


Ma ub͕u a, onye-nwem, Jehova nādi ndu, nkpuru-obi-gi nādi kwa ndu, ebe Jehova b͕ochiworo gi ka i ghara ibà n'ikpe-ọmuma ọbara, ka aka-gi ghara kwa izọputa gi, ub͕u a kwa ka ndi-iro-gi na ndi nāchọ ime onye-nwem ihe ọjọ di ka Nebal.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan