Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 2:26 - Bible Nso

26 Abnea we kpọ Joab òkù, si, Ọ̀ bu rue mb͕e ebighi-ebi ka mma-agha gēripia? ì maghi na ilu ka ọ gādi n'ikpe-azu? rù kwa ole mb͕e ka i nāgaghi-asi ndi-gi ka ha si n'iso umu-nne-ha laghachi?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

26 Mgbe ahụ, Abna kpọrọ Joab oku sị ya, “Ọ bụ ruo ole mgbe ka anyị ga na-eji mma agha na-egburita onwe anyị? Olee mgbe ị ga-akpọghachi ndị gị ka ha hapụ ịchụ na igbu ụmụnne ha? Ị maghị na ihe dị otu a ga-eweta obi ilu?”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 2:26
17 Iomraidhean Croise  

Devid we si onye-ozi ahu, Otú a ka i gāsi Joab, Ka ihe a ghara ijọ njọ n'anya-gi, n'ihi na mma-agha nēripia otù onye dika ọ nēripa onye ọzọ: me ka agha-gi di ike megide obodo ahu, kwadà ya: gi me kwa ka ọ di ike.


Abnea we si Joab, Biko, ka umu-okorọbia bilie, me ihe-ọchì n'iru ayi. Joab we si, Ka ha bilie.


Ha we jide, nwoke ọ bula o jide isi ibe-ya, we ma mma-agha-ya n'akuku ibe-ya; ha we dakọ n'otù: ewe kpọ aha ebe ahu Helkat-hazurim, nke di na Gibeon.


Umu Benjamin we chikọta onwe-ha iso Abnea n'azu, ha we ghọ otù usu, guzo, n'elu otù ugwu ntà.


Joab we si, Chineke nādi ndu, ọ buru na i kwughi, n'ezie mb͕e ahu site n'ututu ndim gārigowori, nwoke ọ bula site n'iso nwa-nne-ya.


Rùe ole mb͕e unu ganēsiri okwu ọnyà? Ghọtanu, ma emesia ayi gēkwu.


Rùe ole mb͕e unu gēme ka nkpuru-obim rue újú? Rùe ole mb͕e unu gēwere okwu zọpiam?


Umu madu, rùe ole mb͕e ka nsọpurum gāghọ itiye n'ọnọdu-ihere? Unu nāhu ihe-efu n'anya, nāchọ okwu-ugha.


Dika mb͕e madu nērùpu miri, otú a ka isi-nmalite ise-okwu di: N'ihi ya tutu ilu-ọ̀gù esie ike rapu ya.


ma ọ buru na unu aju, we nupu isi, mma-agha gērichapu unu: n'ihi na ọnu Jehova ekwuwo.


N'elu ebe nile di elu nke ọhia nādighi nke di n'ọzara ka ndi nāpunara madu ihe biaworo: n'ihi na mma-agha Jehova nwere nēripia site n'otù nsọtu nke ala we rue nsọtu ọzọ nke ala: ọ dighi udo anu-aru ọ bula, bú madu, nwere.


N'efu ka M'tib͕uworo umu-unu; ọ dighi ọdidọ-aka-na-nti ha natara: mma-agha-unu erichapuwo ndi-amuma-unu, dika ọdum nke nēbibi ebibi.


Rùe ole mb͕e ka m'gāhu ọkọlọtọ, nu olu opì-ike?


Ma ubọchi ahu diri Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, ọ bu ubọchi ibọ̀-ọ́bọ̀, ka O we bọ̀rọ Onwe-ya ndi nēmegide Ya ọ́bọ̀: mma-agha gēripia kwa, afọ eju kwa ya, ọ gāṅuju kwa ọbara-ha afọ: n'ihi na àjà ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nwere n'ala Ugwu n'akuku osimiri Yufretis.


Gosinu n'Ijipt, menu ka anuru ya na Migdol, me-kwa-nu ka anuru nime Nof na nime Tahpanhes: sinu, Guzo onwe-gi, dozi-kwa-ra onwe-gi; n'ihi na mma-agha eripiawo buruburu gi.


Mma-agha gēfeghari kwa n'obodo-ya nile, me ka ihe-ntuchi-ya nile gwusia, ripia ha, site na ndum-ọdu nile ha.


N'ubọchi soni o we me ka ha hu ya anya mb͕e ha nālu ọ̀gù, o we mebe ka ha dirita n'udo, si, Ndikom, unu bu umu-nne; gini mere unu nēmejọrita onwe-unu?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan