Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 2:18 - Bible Nso

18 Umu-ndikom Zeruaia atọ nọ kwa n'ebe ahu, bú Joab, na Abishai, na Asahel: ma ukwu Asahel di nfe n'ib͕a ọsọ dika otù nime mb͕ada nke di n'ọhia.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 Ụmụ Zeruaya atọ nọ nʼebe ahụ, ya bụ, Joab, na Abishai na Asahel. Asahel bụ nwoke na-agba ọsọ dịka mgbada.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 2:18
19 Iomraidhean Croise  

Sọl na Jonatan bu ndi nāhurita onwe-ha n'anya, buru kwa ndi di utọ na ndu-ha, Ekewaghi kwa ha n'ọnwu-ha; Ha di garagara kari ugo, Ha di ike kari ọdum.


Joab nwa Zeruaia we mara na obi eze di n'ebe Absolom nọ.


Asahel we chua Abnea n'azu; ma o sighi n'iso Abnea wezuga onwe-ya ije n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe.


O nēdozi ukwum ka ha di ka ukwu nne-ele: N'elu ebem di elu ka Ọ nēguzokwam.


Asahel nwa-nne Joab bu otù onye n'etiti orú ndikom na iri ahu; Elhanan nwa Dodo nke Bet-lehem;


Ọzọ kwa, gi onwe-gi amawo ihe Joab nwa Zeruaia merem, ihe o mere ndi-isi abua nke usu-ndi-agha nile nke Israel, bú Abnea nwa Nea na Amasa nwa Jeta, na o b͕uru ha, we wusi ọbara agha n'udo, tiye ọbara agha n'ihe-ọkiké-ya nke di n'úkwù-ya, na n'akpukpọ-ukwu-ya nke di n'ukwu-ya abua.


Ndi-dike nke usu nile nke ndi-agha kwa; Asahel nwa-nne Joab, Elhanan nwa Dodo nke Bet-lehem;


Ufọdu nime ndi Gad kewaputa-kwa-ra onwe-ha jekuru Devid rue ebe ahu ewusiri ike n'ọzara, ndi-dike bu dìnkpà, ndikom usu-ndi-agha ibu agha, ndi nēdo ọta na ube n'usoro; iru-ha bu kwa iru ọdum, ha di kwa ngwa dika mb͕ada n'elu ugwu;


Iza, bú onye-isi, Obadaia, bú nke-abua, Elaiab, bú nke-atọ;


Onye-isi nke-anọ nke diri ọnwa nke-anọ bu Asahel nwa-nne Joab, Zebadaia nwa-ya so-kwa-ra ya: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n'òkè-ya.


O nēdozi ukwum ka ha di ka ukwu nne-ele: N'elu ebem di elu ka O nēguzokwam.


M'laghachiri, hu n'okpuru anyanwu, na ọ bughi ndi nwere ukwu ọsọ ka iwu-ọsọ diri, ọ bughi kwa ndi di ike ka agha diri, ọzọ kwa, ọ bughi ndi mara ihe ka nri diri, ọzọ kwa, ọ bughi ndi-nghọta ka àkù diri, ọzọ kwa, ọ bughi ndi-ǹkà ka amara diri; kama mb͕e na ihe-ndaputa nādabàra ha nile.


Rue mb͕e ifufe anyasi nēfe n'ubọchi, mb͕e onyinyo nile nāb͕alaga kwa, Chigharia, gi onye ihe-gi nātọm utọ, me onwe-gi ka i yie mb͕ada ma-ọbu nwa-ele N'elu ugwu nile nke Beta.


B͕alaga, gi onye ihe-gi nātọm utọ, Yi kwa mb͕ada ma-ọbu nwa-ele N'elu ugwu nile nke uda di iche iche.


Ebe-nb͕alaga gālanari kwa onye ukwu ọsọ n'iyì, onye di ike agaghi-ab͕a kwa ike-ya ume, dike agaghi-ewepuga onwe-ya:


Jehova, bú Onye-nwe-ayi, bu ikem, Ọ nēme kwa ukwum abua ka ha di ka ukwu ele, Ọ bu kwa n'ebem nile di elu ka Ọ gēme ka M'zọ ije. Ọ diri Onye-isi Abù, n'ubọ-akwaram nile.


Devid we za, si Ahimelek, bú onye Het, si kwa Abishai nwa Zeruaia, bú nwa-nne Joab, si, Ònye gēsorom ridakuru Sọl, rue ọmuma-ulo-ikwū? Abishai we si, Mu onwem gēsoro gi rida.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan