Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 19:9 - Bible Nso

9 Ndi Israel nile we nēse okwu n'ebo nile nke Israel, si, Eze naputara ayi n'ọbu-aka ndi-iro-ayi, ya onwe-ya me kwa-ra ka ayi wepuga onwe-ayi n'ọbu-aka ndi Filistia; ma ub͕u a o siwo n'ala b͕alaga n'ihi Absalom.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Nʼetiti ebo Izrel niile, ndị mmadụ nọ na-arụ ụka na-asị, “Eze napụtara anyị site nʼaka ndị iro anyị. Ọ bụ ya napụtara anyị site nʼaka ndị Filistia. Ma ugbu a, o sitela nʼala a gbapụ nʼihi Absalọm.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 19:9
15 Iomraidhean Croise  

Devid we si ndi-orù-ya nile, ndi ya na ha nọ na Jerusalem, Bilienu, ka ayi b͕apu; n'ihi na ayi enweghi nb͕apu n'iru Absalom: menu ngwa ije, ka o we ghara ime ngwa rue ayi aru, me ka ihe ọjọ kwagide ayi, were ọnu mma-agha tib͕ue obodo a.


Ha we were Absalom, tubà ya n'olùlù uku n'oké ọhia ahu, me ka oké obo uku nke nkume guzo n'elu ya: Israel nile we b͕alaga, onye ọ bula n'ulo-ikwū-ya


Ma Absalom, onye ayi tere manu ibu isi-ayi, anwuwo n'agha. Ma ub͕u a n'ihi gini ka unu onwe-unu nādighi-ekwu ime ka eze lata?


Eze we gabiga rue Gilgal, Kimham so-kwa-ra ya gabiga: ndi nile nke Juda we me ka eze gabiga, ha na nkera ndi Israel.


I we me ka m'b͕apu n'ilu-ọ̀gù nile nke ndim; I nēdebem ka m'buru isi mba nile ọzọ: Ndi m'nāmaghi gēfèm òfùfè.


Devid we biarue Beal-perazim, Devid we tib͕ue ha n'ebe ahu; o we si, Jehova ekwopuwo megide ndi-irom n'irum, dika nkwopu miri. N'ihi nka ka ọ kpọrọ aha ebe ahu Beal-perazim.


I nēme ka m'b͕apu n'ilu-ọ̀gù nile nke ndim; I nēdom onye-isi mba nile ọzọ Ndi m'nāmaghi gēfèm òfùfè.


M'we si ha, Onye ọ bula nke nwere ọla-edo, ka ha tijipu ya n'aru ha; ha we nyem: m'we tubà ya n'ọku, nwa-ehi a we puta.


Devid we were èbè, were kwa nkume, kwa onye Filistia n'ike, o we tib͕ue onye Filistia ahu, me ka ọ nwua; ma mma-agha adighi n'aka Devid.


Sọl we si, Otú a ka unu gāsi Devid, Ọ dighi ego-ilu-nwunye gātọ eze utọ, kama ọgu api ise nke ndi Filistia, ka o we bọrọ onwe-ya ọ́bọ̀ n'aru ndi-iro eze. Ma Sọl chère ime ka Devid da ada n'aka ndi Filistia.


n'ihi na o tiyere ndu-ya n'ọbu-aka-ya, tib͕ue onye Filistia ahu, Jehova we zọputa nzọputa uku bayere Israel nile: i huru ya anya, we ṅuria ọṅu: n'ìhi gini kwa ka i gēmehie megide ọbara nēmeghi ihe ọjọ, ime ka Devid nwua n'efu?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan