Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 19:5 - Bible Nso

5 Joab we bakuru eze n'ulo, si, I mewo ka ihere me iru ndi-orú-gi nile ta, bú ndi nēwepuga ndu-gi, na ndu umu-gi ndikom na nke umu-gi ndinyom, na ndu ndinyom-i, na ndu ndi-iko-gi nwayi, ta;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Emesịa, Joab jekwuuru eze nʼụlọ sị ya, “Anyị zọpụtara ndụ gị, na ndụ ụmụ gị ndị ikom na ndị inyom, na ndị nwunye gị, na ndị iko gị nwanyị taa, ma lee ka ị si emeso anyị. Ị na-eme ka ihere mee anyị, dịka a ga-asị na anyị mere ihe ọjọọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 19:5
9 Iomraidhean Croise  

Ma Devid nārigo na nrigo ugwu Olive, nārigo nākwa ákwá; ekpuchi-kwa-ra isi-ya, ya onwe-ya nēje kwa b͕ara ukwu efu: ndi nile ndi soro ya je kpuchi-kwa-ra, nwoke ọ bula isi-ya, ha we rigo, nārigo nākwa ákwá.


Ha we were Absalom, tubà ya n'olùlù uku n'oké ọhia ahu, me ka oké obo uku nke nkume guzo n'elu ya: Israel nile we b͕alaga, onye ọ bula n'ulo-ikwū-ya


Amasa ka unu gāsi kwa, Ọ̀ bughi ọkpukpum na anu-arum ka i bu? Chineke mem otú a, mekwam ihe ọzọ otú a, ma ọ buru na i ghọghi onye-isi usu-ndi-agha n'irum ubọchi nile n'ọnọdu Joab.


Ma eze kpuchiri iru-ya, eze we tie nkpu n'oké olu, si, Nwam Absalom, Absalom, nwam, nwam!


n'ihu ndi nākpọ gi asi n'anya, na n'ikpọ ndi nāhu gi n'anya asi. N'ihi na i gosiwo ta, na ndi-isi na ndi-orù abughi ihe n'anya-gi: n'ihi na amawom, ta, na asi na Absalom adiwo ndu, asi kwa na ayi nile anwuwo ta, mb͕e ahu o gēzi ezi n'anya-gi.


Ma mu onwem akaghi aru ta, ọ bu ezie na abum onye etere manu ibu eze; ndikom ndia, bú umu Zeruaia, di kwa ike karim: Jehova kwughachi onye nēme ihe ọjọ dika ihe ọjọ ya si di.


I we nye ha n'aka ndi nākpab͕u ha, ha we kpab͕ue ha: ma na mb͕e nkpab͕u-ha, ha we tikue Gi, Gi onwe-gi we site n'elu-igwe nu, nye ha ndi-nzọputa dika ọtutu obi-ebere-Gi nile si di, ha we zọputa ha n'aka ndi nākpab͕u ha.


Jehova nwe nzọputa: Ka ngọzi-Gi dikwasi ndi-Gi. Selah


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan