Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 19:39 - Bible Nso

39 Ndi Devid nile we gabiga Jọdan, eze gabiga-kwa-ra: eze we sutu Bazilai ọnu, gọzie ya: o we laghachi n'ebe-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

39 Ya mere, ndị ahụ niile gabigara Jọdan, mgbe ahụ eze gabigakwara. Eze suturu Bazilai ọnụ, gọziekwa ya, Bazilai laghachiri nʼụlọ ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 19:39
18 Iomraidhean Croise  

Ọ we gọzie ya, si, Onye agọziri agọzi ka Abram bu site n'aka Chineke Nke kachasi ihe nile elu, bú Onye-nwe elu-igwe na uwa:


Ka Chineke Nke puru ime ihe nile gọzie gi, me ka i mua, ọmùmù, Ya me kwa ka i ba uba, ka i we ghọ nkpọkọta nke ndi di iche iche:


Leban we bilie n'isi-ututu, sutu umu-ya ndikom na umu-ya ndinyom ọnu nke-uku, gọzie ha: Leban we la, laghachi n'ebe nke ya.


Ọ we sutu umu-nne-ya nile ọnu, kwakwasi ha ákwá: emesia umu-nne-ya kpayere ya uka.


Jekob we gọzie Fero, si n'iru Fero pua.


Josef we me ka Jekob nna-ya bata, o guzo ya n'iru Fero: Jekob we gọzie Fero.


Eze we si Absalom, É-è, nwam, biko, emela ka ayi nile je, ka ayi we ghara ibu edi arọ́ n'isi gi. O rugid ya: ma o kweghi ije, ma ọ gọziri ya.


Joab we biakute eze, gosi ya: o we kpọ Absalom, o we biakute eze, kpọ isi ala nye ya, kpuchie iru-ya n'ala n'iru eze: eze we sutu Absalom ọnu.


Eze we si, Kimham gēsom gabiga, mu onwem gēme-kwa-ra ya ihe di nma n'anya-gi: ma ihe ọ bula i gārọputa ka m'mere gi, m'gēmere gi ya.


Devid we surebìe àjà-nsure-ọku ahu na àjà-udo nile, gọzie ndi Israel n'aha Jehova nke usu nile nke ndi-agha.


Devid we lata igọzi ulo-yaz. Maikal, bú nwa-nwayi Sọl, we puta izute Devid, si, Le, otú eze Israel di nsọpuru nke-uku ta, onye kpupuru uwe n'aru-ya ta n'anya ndi-orù-nwayi nke ndi-orù-ya, dika otù nime ndikom efu nēkpupu uwe n'aru-ya ekpupu!


O we rapu ìgwè ehi-ya, b͕aso Elaija n'azu, si, Biko, ka m'sutu nnam na nnem ọnu, m'gējeso kwa gi. Ọ si ya, Laghachi; n'ihi na ọ̀ bu gini ka m'meworo gi?


Belam we bilie, je, laghachi n'ebe-ya; ọzọ kwa, Belak jere n'uzọ-ya.


Simeon we gọzie ha, si kwa Meri nne-Ya, Le, edowo Nwa nka ka Ọ buru ọdida na nbili nke ọtutu madu n'Israel; ka Ọ buru kwa ihe-iriba-ama anēkwu okwu megide;


Ha nile we kwa ákwá nke-uku, dakwasi Pọl n'olu, sutu kwa ya ọnu,


Werenu isutu-ọnu di nsọ kele umu-nna-ayi nile.


Ha we welie olu-ha, kwa /akw/a ọzọ: _Opa we sutu nne di-ya ọnu; ma Rut rapara n>aru ya.


Devid we ṅuara Sọl iyi. Sọl we laghachi; ma Devid na ndikom-ya rigoro n'ebe ahu ewusiri ike.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan