Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 19:22 - Bible Nso

22 Devid we si, Gini ka mu na unu nwekọrọ, umu-ndikom Zeruaia, na unu gāburum onye-nmegide ta? àgēme ka nwoke ọ bula nwua n'Israel ta? n'ihi na ọ̀ bu na amaghm na ta ka mu onwem bu eze Israel?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 Ma Devid sịrị, “Gịnị jikọtara mụ na unu ụmụ ndị ikom Zeruaya, nke mere na taa unu aghọọla ndị na-emegide m? O kwesiri ka e gbuo onye ọbụla nʼala Izrel taa? Ọ bụ na m amaghị na taa, abụ m eze Izrel?”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 19:22
11 Iomraidhean Croise  

Eze we si, Gini ka mu na unu nwekọrọ umu Zeruaia? mb͕e ọ nākọcha, mb͕e Jehova siwo-kwa-ra ya, Kọcha Devid; ònye gāsi kwa, Gini mere i meworo otú a?


Eze, bú Devid, we biarute Bahurim, ma, le, otú nwoke nke sitere n'ab͕uru ulo Sọl nēsi n'ebe ahu puta, aha-ya bu Shimai, nwa Gira: ọ nāputa, nākọcha ka ọ nāputa.


Abishai nwa Zeruaia we si eze, N'ìhi gini ka nkita nka nke nwuru anwu nākọcha onye-nwem, bú eze? biko, ka m'gabiga, wezuga isi-ya.


Ma mu onwem akaghi aru ta, ọ bu ezie na abum onye etere manu ibu eze; ndikom ndia, bú umu Zeruaia, di kwa ike karim: Jehova kwughachi onye nēme ihe ọjọ dika ihe ọjọ ya si di.


Agēme kwa ka otù oche-eze guzosie ike n'ebere, otù onye gānọkwasi kwa ya n'ezi-okwu, n'ulo-ikwū Devid; bú onye nēkpe ikpe, nāchọ kwa ikpé ziri ezi, nēme kwa ngwa ime ezi omume.


Ma le, ha tiri nkpu, si, Gini ka ayi na Gi nwekọrọ, Gi Ọkpara Chineke? Ì biara ebe a imekpa ayi aru mb͕e oge-ayi akērughi?


Sọl we si, Ọ dighi nwoke agēme ka ọ nwua ta: n'ihi na ta ka Jehova zọputara nzọputa n'Israel.


Ya burum ihe-árú sitere na Jehova, bú iseti akam megide onye Jehova etere manu: ma ub͕u a, biko, were ube di n'akuku isi-ya, na ite miri, ka ayi la.


Abishai we si Devid, Chineke emechibidowo onye-iro-gi nye n'aka-gi ta: ma ub͕u a, biko, ka m'were ube tugide ya n'ala otù ub͕ò, m'gaghi-atu kwa ya nke ub͕ò abua.


Devid we si Abishai, Ebibila ya: n'ihi na ònye ka ikpe nāmaghi n'iseti aka-ya megide onye Jehova etere manu?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan