Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 19:20 - Bible Nso

20 N'ihi na orù-gi amawo na mu onwem emehiewo: ma, le, abiawom ta, buru ulo nile nke Josef uzọ irida izute onye-nwem, bú eze.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 nʼihi na mụ bụ ohu gị maara na m mehiere, ma taa abịara m dịka onye mbụ site nʼagbụrụ Josef, ịbịa zute onyenwe m, bụ eze.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 19:20
12 Iomraidhean Croise  

Israel we setia aka-nri-ya tukwasi ya n'isi Efraim, onye bu nke-ntà, na aka-ekpe-ya n'isi Manase, nātub͕a aka-ya abua; n'ihi na Manase bu ọkpara.


Ọ we gọzie ha n'ubọchi ahu, si, Nime gi ka Israel gāgọzi, si, Chineke me gi ka i di ka Efraim, ka i di kwa ka Manase: ọ we do Efraim n'iru Manase.


Eze, bú Devid, we biarute Bahurim, ma, le, otú nwoke nke sitere n'ab͕uru ulo Sọl nēsi n'ebe ahu puta, aha-ya bu Shimai, nwa Gira: ọ nāputa, nākọcha ka ọ nāputa.


Abishai nwa Zeruaia we za, si, Àgaghi-eme ka Shimai nwua n'ihi nka, n'ihi na ọ kọchara onye Jehova etere manu?


Ndi Israel nile we nēse okwu n'ebo nile nke Israel, si, Eze naputara ayi n'ọbu-aka ndi-iro-ayi, ya onwe-ya me kwa-ra ka ayi wepuga onwe-ayi n'ọbu-aka ndi Filistia; ma ub͕u a o siwo n'ala b͕alaga n'ihi Absalom.


O rue, mb͕e Israel nile nuru na Jeroboam alatawo, ha we zìe kpọ ya ibia na nzukọ-ha, ha we me ya eze Israel nile: ọ dighi ebo ọ bula soro ulo Devid, ma-ọbughi ebo Juda, nání ya.


Jeroboam we wue Shekem n'ugwu Efraim, biri n'ebe ahu; o si n'ebe ahu pua, wue Penuel.


Gi nwanyi nēbi na Lebanon, nke nālu akwu-gi n'etiti osisi cedar nile, le, ka i si buru onye agēmere amara nke-uku mb͕e ihe-nb͕u nābiakwasi gi, nb͕ali dika nke nwanyi ime nēme!


M'gāla, lata n'ọnọdum, rue mb͕e ikpe gāma ha, ha we chọ irum: n'ahuhu-ha ka ha gāchọsim ike.


Mu onwem mara Efraim, Israel ezonarighkwam: n'ihi na ub͕u a i kwawo iko, Efraim, emeruwo Israel.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan