Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 18:9 - Bible Nso

9 Absalom we zute ndi-orù Devid. Ma Absalom nānọkwasi n'inyinya mule-ya, inyinya mule ahu we ba n'okpuru alaka tuhiri atuhi nke oké osisi terebinth, isi-ya we kogide n'osisi terebinth ahu, ewe do ya n'etiti elu-igwe na ala; ma inyinya mule ahu nke di n'okpuru ya gabigara.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Absalọm zutere ndị agha Devid. Ọ na-anọkwasị nʼelu ịnyịnya ya nʼoge a, dịka ịnyịnya ahụ sitere nʼokpuru osisi ook ukwu dị nʼọhịa ahụ na-agbafee, agịrị isi ya konyere nʼalaka osisi ahụ, tụhịkọtaakwa, nke mere na ọ kwụrụ nʼetiti eluigwe na ala. Ma ịnyịnya ya gbaara na-aga.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 18:9
18 Iomraidhean Croise  

Umu-okorọbia Absalom we me Amnon dika Absalom nyere iwu. Umu-ndikom eze nile we bilie, rikwasi, nwoke ọ bula n'elu inyinya mule-ya, ha we b͕alaga.


Ma mb͕e ọ kọpuru isi-ya, (n'ihi na ọ bu n'ogwugwu arọ n'ọgwugwu arọ ka ọ nākọpu ya: n'ihi na agiri-isi di arọ́ n'isi-ya, o we kọpu ya:) o we tua agiri-isi di n'isi-ya ọgu shekel iri, n'ihe-ọtùtù eze.


Ma Ahitofel huru na emeghi ihe ọ duru n'ọdu, o we jikwa inyinya-ibu-ya, bilie, la n'ulo-ya, rue obodo-ya, o we nye ulo-ya iwu, kwub͕u onwe-ya: o we nwua, elíe ya n'ílì nna-ya.


Otù nwoke we hu ya, gosi Joab, si, Le, ahurum Absalom ka ọ kwuru n'osisi terebinth.


Joab we si, Ọ bughi otú a ka m'ganēche n'iru gi. O we chiri nkpa-n'aka atọ n'aka-ya, dubà ha n'obi Absalom, mb͕e ọ nānọ na ndu n'etiti osisi terebinth.


Ewe nāb͕asa agha ahu n'ebe ahu n'elu ala ahu nile; oké ọhia ahu we ripia ọtutu madu n'etiti ndi Israel n'ubọchi ahu kari ndi mma-agha ripiara.


Ọ̀ bughi nhuju-anya n'ebe onye ajọ omume nọ, Na oké ahuhu n'ebe ndi nēme ajọ ihe nọ?


Onye nākọcha nna-ya ma-ọbu nne-ya, Oriọna-ya gānyu na nb͕achi nke ọchichiri.


Anya nke nākwa nna-ya emò, Nke nēleda kwa iṅa nne-ya nti, Ugolo-ọma nke ndagwurugwu gāghuputa ya, Umu-ugo gēri kwa ya.


Onye ahu nke nāb͕apu n'iru oké egwu ahu gādabà n'olùlù ahu; ọzọ, onye ahu nke nārigoputa n'òlùlù ahu, agējide ya n'ib͕udu ahu: n'ihi na M'gēme ka arọ nleta-ha biakute ya, bú Moab; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


O we tubà ego ọla-ọcha ahu nile n'ulo nsọ, wezuga onwe-ya; o we je, kwub͕u onwe-ya.


N'ihi na Moses siri, Sọpuru nna-gi na nne-gi; na, Onye kwujọrọ nna ma-ọbu nne, ya nwua ọnwu ahu:


Kraist b͕aputara ayi n'ọbubu-ọnu nke iwu ahu, ebe Ọ ghọrọ ọbubu-ọnu n'ọnọdu-ayi: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye anabu ọnu ka ọ bu, bú onye ọ bula nke anākwuba n'elu osisi:


ozu-ya agaghi-adigide n'elu osisi abali nile, kama i ghaghi ilì ya n'ubọchi ahu; n'ihi na ihe-nkọcha nke Chineke ka onye a kwugburu akwugbu bu; ka i ghara imeru ala-gi, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ka ọ buru ihe-nketa.


Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye nēlelì nna-ya ma-ọbu nne-ya. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.


Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye ya na nwunye nna-ya nēdina; n'ihi na o kpughewo uwe kpuchiri ọtọ nna-ya. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan