Joshua we si ha, Ọ buru ndi bara uba ka i bu, rigorue oké ọhia n'onwe-gi, b͕utu-kwa-ra onwe-gi n'ebe ahu n'ala ndi-Perizait na Refaim; ebe ugwu Efraim diri gi nkpa.
n'ihi na ugwu ahu ka i gēnwe; n'ihi na oké ọhia ka ọ bu, i gēb͕utu kwa ya, i gēnwe kwa ọpupu-ya nile: n'ihi na i gānapu ndi Kenean ala-ha, ọ bu ezie na ha nwere ub͕ọ-ala ígwè, ọ bu kwa ezie na ndi di ike ka ha bu.