Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 18:28 - Bible Nso

28 Ahimaaz we kpọ òkù, si eze, Udo. Ọ kpọ isi ala nye eze, kpuchie iru-ya n'ala, si, Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke-gi, bu, Onye mechibidoworo ndikom ahu ndi weliri aka-ha imegide onye-nwem, bú eze.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

28 Mgbe ahụ, Ahimaaz kpọrọ eze oku sị, “Udo!” Ọ kpọrọ isiala nye eze. Kpuokwa ihu ya nʼala sị, “Ngọzị na-adịrị Onyenwe anyị Chineke gị. Onye nke mebiri nzube ndị ahụ niile weliri aka imegide onyenwe m bụ eze.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 18:28
16 Iomraidhean Croise  

ọ bu kwa Onye agọziri agọzi ka Chineke Nke kachasi ihe nile elu bu, Onye raworo ndi nākpab͕u gi nye n'aka-gi. Ọ we nye ya otù uzọ n'uzọ iri nime ihe nile.


si, Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke nke onye-nwem Abraham, bu, Onye nārapughi ebere-Ya na ezi-okwu-Ya n'ebe onye-nwem nọ: mu onwem, n'uzọ ka Jehova duworom rue ulo umu-nne onye-nwem.


o rue, nubọchi nke-atọ, na, le, otù nwoke siri n'ọmuma-ulo-ikwū puta, site n'ebe Sọl nọ, uwe-ya nile dọwara adọwa, ájá dikwasi n'isi-ya: o rue, mb͕e ọ biakutere Devid, na ọ daruru ala, we kpọ isi ala.


Nwayi Tekoa we gwa eze okwu, da kpue iru-ya n'ala, kpọ isi ala, si, Zọputam eze.


N'ebe onye di ọcha nọ I gēgosi Onwe-gi onye di ọcha; Ma n'ebe onye b͕agọro ab͕agọ nọ I gēgosi Onwe-gi Onye-nb͕á.


Ma n'ubọchi nke-anọ ha kpọkọtara onwe-ha na ndagwurugwu Beraka; n'ihi na n'ebe ahu ka ha gọziri Jehova: n'ihi nka ka ha kpọrọ aha ebe ahu, Ndagwurugwu Bekara, rue ta.


Ọ bughi ayi, Jehova, ọ bughi ayi, Kama ọ bu aha-Gi ka I gēnye nsọpuru, N'ihi ebere-Gi, na n'ihi ezi-okwu-Gi.


Onye agọziri agọzi ka Jehova bu, Onye nēnyeghi ayi iburu ezé-ha anu-ndọb͕u.


I mechibidoghkwam nye n'aka onye-iro; I mewo ka ukwum abua guzo n'ebe sara mbara.


Jetro we si, Onye agọziri agọzi ka Jehova bu, Onye naputaworo unu n'aka ndi Ijipt, na n'aka Fero; Onye naputaworo ndi nka n'okpuru aka ndi Ijipt.


Ubọchi ta ka Jehova gēmechibido gi nye n'akam; m'gētib͕u kwa gi, wezuga isi-gi n'aru gi; m'gēwere kwa ozu ndi ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia nye anu-ufe nke elu-igwe, nye kwa anu-ọhia nke uwa ta; ka uwa nile we mara na Chineke diri Israel:


Gi onwe-gi egosiwo ta na i mewo ezi ihe n'ebe m'nọ: n'ihi na mb͕e Jehova mechibidorom nye n'aka-gi, i b͕ughm.


Abigail we hu Devid, me ngwa, si n'inyinya-ibu-ya rida, da kpue iru-ya n'ala n'iru Devid, kpọ isi ala.


Abishai we si Devid, Chineke emechibidowo onye-iro-gi nye n'aka-gi ta: ma ub͕u a, biko, ka m'were ube tugide ya n'ala otù ub͕ò, m'gaghi-atu kwa ya nke ub͕ò abua.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan