Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 18:19 - Bible Nso

19 Ahimaaz nwa Zedok we si, Biko, ka m'b͕a ọsọ zìe eze ozi ọma, na Jehova ekpeputawo ya n'aka ndi-iro-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 Mgbe ahụ, Ahimaaz, nwa Zadọk, bịakwutere Joab sị ya, “Biko, ka m gbara ọsọ gaa zie eze oziọma a, na Onyenwe anyị azọpụtala ya site nʼaka ndị iro ya.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 18:19
15 Iomraidhean Croise  

Eze we si Zedok, bú onye-nchu-àjà, Ọ̀ bughi onye-ọhu-uzọ ka i bu? laghachi n'obodo n'udo, unu na Ahimaaz nwa-gi, na Jonatan nwa Abaiata, bú umu-unu abua.


Le, ha na umu-ha ndikom abua nọ n'ebe ahu, bú Ahimaaz nwa Zedok, na Jonatan nwa Abaiata; site n'aka-ha ka unu gēzite-kwa-ram okwu ọ bula unu gānu.


Ma Jonatan na Ahimaaz nēguzo n'En-rogel; nwayi nēje ozi we je gosi ha; ndi ahu we je gosi eze, bú Devid: n'ihi na ọ gaghi-ekwe me, bú ka ahú ka ha ba n'obodo.


Joab we si ya, Ọ bughi onye ozi ọma ka i gābu ta, kama i gēzi ozi ọma ubọchi ọzọ: ma ta i gaghi-ezí ozi ọma, n'ihi na nwa eze anwuwo.


Ma otú ọ di, m'gāb͕a ọsọ, ka o kwuru. Ọ si ya, B͕a ọsọ. Ahimaaz we b͕a ọsọ Buruburu-ala, b͕abiga onye Kush ahu.


Ma, le, onye Kush biara; onye Kush we si, Ka ezìe onye-nwem, bú eze, ozi ọma: n'ihi na Jehova ekpeputawo gi ta n'aka ndi nile nēbili imegide gi.


I huwo ya; n'ihi na Gi onwe-gi nēlegide nmeb͕u na nkpasu-iwe, itiye ya n'aka-Gi: N'aka-Gi ka onye nāhuju anya nārapu onwe-ya; Onye nēyere nwa-nb͕ei aka ka I buworo.


Ikpe nwa-nb͕ei na onye anāzọpia azọpia ikpe, Ka madu nke sitere n'uwa we ghara ime ka madu ma kwa jijiji ọzọ.


Bilie, Jehova, n'iwe-Gi, Welie Onwe-gi elu imegide nrubiga-ókè-iwe nke ndi nākpab͕um: Teta-kwa-ram; I nyewo ikpé iwu.


Jehova emewo ka amara Ya onwe-ya, ezi ikpe ka O kpeworo: N'ọlu nke ọbu-aka-ya abua ka amaworo onye nēmebi iwu dika n'ọnyà. Higgaion. Selah


N'ihi na I kpewo ikpem ziri ezi na okwu-ikpem; I nọduru n'oche-eze, buru onye-ikpe nēme ezi omume.


Otù ọb͕a-ọsọ gāb͕a ọsọ izute ọb͕a-ọsọ-ibe-ya, otù onye-ngosi gāb͕a kwa ọsọ izute onye-ngosi-ibe-ya, igosi eze Babilon na ewerewo obodo-ya na nsọtu-ya:


Ndi m'huru n'anya, unu abọlara onwe-unu ọ́bọ̀, kama charanu iwe ahu uzọ: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Mu nwe ọ́bọ̀; Mu onwem gēnyeghachi, ka Onye-nwe-ayi kwuru.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan