2 Samuel 18:12 - Bible Nso12 Nwoke ahu we si Joab, Ọ buru kwa na mu onwem ejide n'ọbu-akam nnù ọla-ọcha abua na ọgu iri, ma m'gaghi-eseti akam imegide nwa eze: n'ihi na ọ bu na nti-ayi ka eze nyere gi na Abishai na Itai iwu, si, Lezienu anya bayere nwa-okorọbia ahu, bú Absalom, onye ọ bula. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a12 Ma nwoke ahụ zara sị, “A sịkwarị na e nyere m puku ọlaọcha nʼaka m a, agaraghị m egbu ya. Nʼihi na anyị niile nụrụ mgbe eze na-agwa gị na Abishai na Itai sị, ‘Lezienụ anya banyere nwokorobịa bụ Absalọm, nʼihi m.’ Faic an caibideil |