ma ọ buru na i laghachi n'obodo, we si Absalom, Orù-gi ka m'bu, eze; dika mu onwem bu orù nna-gi na mb͕e gara aga, ub͕u a mu onwem gābu kwa orù-gi: i gēmebi-kwa-ram idu-ọdu Ahitofel.
Ahitofel we si Absalom, Bakuru ndi-iko nna-gi ndinyom, ndi o mere ka ha nọdu iche ulo; Israel nile gānu kwa na i nēsi nna-gi ísì ọjọ: aka ndi nile gi na ha nọ gādi kwa ike.
Hushai we biakute Absalom, Absalom we gwa ya okwu, si, Dika okwu a si di ka Ahitofel kwuru: àyi gēme ihe o kwuru? ọ buru na ayi agaghi-eme ya, gi onwe-gi kwue.