Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 17:23 - Bible Nso

23 Ma Ahitofel huru na emeghi ihe ọ duru n'ọdu, o we jikwa inyinya-ibu-ya, bilie, la n'ulo-ya, rue obodo-ya, o we nye ulo-ya iwu, kwub͕u onwe-ya: o we nwua, elíe ya n'ílì nna-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

23 Mgbe Ahitofel hụrụ na-emeghị ndụmọdụ ya, o biliri jikwaa ịnyịnya ibu ya, laa nʼụlọ ya nʼobodo ya. Mgbe o ruru nʼụlọ ya, o doziri nʼezinaụlọ ya nʼusoro, were ụdọ kwụgbuo onwe ya. Ọ nwụrụ. E lie ya nʼili nna ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 17:23
15 Iomraidhean Croise  

Absalom we zipu Ahitofel onye Gailo, bú onye nādu Devid ọdu, n'obodo-ya, bú Gailo mb͕e ọ nāchu àjà. Nkekọta ahu we di ike; ndi Israel nāba kwa uba nēje n'iru n'iru n'aka Absalom.


Otú onye we gosi Devid, si, Ahitofel di n'etiti ndi-nkekọta ahu ndi nēso Absalom. Devid we si, Biko, Jehova, me ka idu-ọdu Ahitofel ghọ ihe-nzuzu.


Ọdu Ahitofel, nke ọ duru na mb͕e ahu, di ka agāsi na ajuru ase n'okwu Chineke: otú a ka idu-ọdu nile nke Ahitofel di, ma n'ebe Devid nọ ma n'ebe Absalom nọ.


Devid we bilie, ya na ndi nile ndi ya na ha nọ, ha we gabiga Jọdan; mb͕e ìhè ututu putara ọ dighi onye fọduru nke nāgabigaghi Jọdan.


O rue, mb͕e Zimri huru na ewerewo obodo, na ọ bara n'ulo-elu nke ulo eze, sure ulo eze n'ọku n'isi onwe-ya, nwua,


Na mb͕e ahu Hezekaia riara ọria inwu anwu. Aisaia, bú onye-amuma, bú nwa Emoz, we biakute ya, si ya, Otú a ka Jehova siri, Nye ulo-gi iwu; n'ihi na gi onwe-gi nānwu anwu, i gaghi-adi kwa ndu.


Ọ̀ bughi nhuju-anya n'ebe onye ajọ omume nọ, Na oké ahuhu n'ebe ndi nēme ajọ ihe nọ?


Nka bu ugwọ-ọlu nke ndi nēmegidem, nke nēsi n'aka Jehova bia, Ọ bu kwa ugwọ-ọlu nke ndi nēkwu ihe ọjọ megide nkpuru-obim.


Ma ha ikpe, Chineke; Ka ha da ada site na ndum-ọdu nile ha: N'uba nke njehie nile ha nupu ha; N'ihi na ha anupuwo isi imegide Gi.


Ma Gi onwe-gi, Chineke, gēme ka ha rida n'olùlù nbibi: Ndi bu ndi-ọbara na ndi-aghughọ agaghi-adiru nkera ubọchi-ha; Ma mu onwem gātukwasi obi na Gi.


N'iru ntipia ka npako nāga, Ọ bu kwa n'iru isu-ngọngọ ka idi-elu nke mọ madu nāga.


Uche b͕agọrọ ab͕agọ nke madu nēkpù uzọ-ya iru; Ọ bu kwa imegide Jehova ka obi-ya di ọku.


Na mb͕e ahu Hezekaia riara ọria inwu anwu. Aisaia, bú onye-amuma, bú nwa Emoz, we biakute ya, si ya, Otú a ka Jehova siri, Nye ulo-gi iwu; n'ihi na onye nānwu anwu ka i bu, I gaghi-adi kwa ndu.


O we tubà ego ọla-ọcha ahu nile n'ulo nsọ, wezuga onwe-ya; o we je, kwub͕u onwe-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan