Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 17:16 - Bible Nso

16 Ma ub͕u a ziganu ngwa ngwa, gosi Devid, si, Anọla ọnọdu abali a n'ala ihe nādighi nke ọzara, kama i ghaghi igabiga; ka aghara iloda eze na ndi nile ndi ya na ha nọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Ugbu a, meenụ ngwa, ziga ozi gwa Devid sị, ‘Anọkwala ọnọdụ abalị nʼụzọ ngabiga nke osimiri nʼime ọzara, kama gabiga na-atụfughị oge, ma ọ bụghị otu a, ma eze ma ndị niile ya na ha soo ga-abụ ndị elodara.’ ”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 17:16
14 Iomraidhean Croise  

Devid we si ndi-orù-ya nile, ndi ya na ha nọ na Jerusalem, Bilienu, ka ayi b͕apu; n'ihi na ayi enweghi nb͕apu n'iru Absalom: menu ngwa ije, ka o we ghara ime ngwa rue ayi aru, me ka ihe ọjọ kwagide ayi, were ọnu mma-agha tib͕ue obodo a.


Lenu, mu onwem ganānọgide na ngabiga-miri nke ọzara, rue mb͕e okwu gēsi n'ebe unu nọ bia igosim ka ihe si di.


Gi na ha anọghi kwa n'ebe ahu, bú Zedok na Abaiata ndi-nchu-àjà? o gēru kwa, na okwu ọ bula i gānu site n'ulo eze, i gēgosi ya Zedok na Abaiata, bú ndi-nchu-àjà.


Ekwela ka ha si n'obi-ha, Ehe, nka bu ọchichọ nkpuru-obi-ayi: Ekwela ka ha si, Ayi elodawo ya.


M'gēwere ọsọsọ si n'ifufe siri ike na n'oké ifufe Biarue ebe-nb͕apu dirim.


Ndi nēchem anwu nēkusi ume ike ilom ogologo ubọchi nile: N'ihi na ha bara uba bú ndi nēbu agha imegidem n'ibuli onwe-ha elu.


O gēsi n'elu-igwe zìe, zọputam, Mb͕e onye nēkusi ume ike ilom nāta uta; Selah Chineke gēziputa ebere-Ya na ezi-okwu-Ya.


Ma mb͕e ọ bula aru a nke puru ire uré gēyikwasiwori ereghi-uré, mb͕e aru a nke puru inwu anwu gēyikwasiwori anwughi-anwu kwa, mb͕e ahu okwu ahu edeworo n'akwukwọ nsọ gēme, bú, Eloro ọnwu rue nmeri.


N'ihi na ayi, bú ndi nọ n'ulo-ikwū a, ayi nāsu udè ezie, ebe ọ nānyib͕u ayi; n'ihi na ayi achọghi ka eyipu ayi ya, kama ka eyikwasi ayi ihe n'elu ya, ka ndu we loda ihe puru inwu anwu.


Jonatan we kpọ òkù n'azu nwa-okoro ahu, si, Me ngwa, je ọsọsọ, eguzola. Nwa-okoro Jonatan we chikọta àkú, biakute onye-nwe-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan