Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 16:16 - Bible Nso

16 O rue, mb͕e Hushai, bú onye-Akait, bú eyì Devid, biakutere Absalom, na Hushai siri Absalom, Ka eze di ndu, ka eze di ndu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Mgbe Hushaị, enyi Devid, onye Akai bịaruru, ọ gara hụ Absalọm sị ya, “Ka eze dị ogologo ndụ, ka eze dị ndụ.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 16:16
13 Iomraidhean Croise  

O rue, na mb͕e Devid biaruru elu nrigo ahu, ebe ọ nākpọ isi ala nye Jehova, le, Hushai, bú onye-Akait, biara izute ya, ya na uwe-ya adọwara adọwa, na ájá n'elu isi-ya.


ma ọ buru na i laghachi n'obodo, we si Absalom, Orù-gi ka m'bu, eze; dika mu onwem bu orù nna-gi na mb͕e gara aga, ub͕u a mu onwem gābu kwa orù-gi: i gēmebi-kwa-ram idu-ọdu Ahitofel.


Hushai, bú eyi Devid, we ba n'obodo; Absalom ba-kwa-ra nime Jerusalem.


N'ihi na ọ ridawo ta, chiri ehi na anu mara abuba na ìgwè ewu na aturu riri nne chua àjà, kpọ kwa umu-ndikom nile nke eze, kpọ kwa ndi-isi usu-ndi-agha, kpọ kwa Abaiata, bú onye-nchu-àjà; ma, le, ha nēri ihe nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu n'iru ya, si, Ka eze, bú Adonaija, di ndu.


ka Zedok, bú onye-nchu-àjà, na Netan, bú onye-amuma, te ya manu n'ebe ahu ibu eze Israel: fù-kwa-nu opì, si, Ka eze, bú Solomon, di ndu.


Azaraia nwa Netan bu onye-isi nke ndi edoro ndi-isi; Zabud nwa Netan bu onye-isi n'ije ozi na eyì eze;


O we me ka nwa eze puta, o kpube ya okpu-eze, nye ya ihe-àmà; ha we me ya eze, te ya manu, kua aka-ha, si, Ka eze di ndu.


Ndi Kaldea we si eze n'asusu Siria, Eze, di ndu rue mb͕e ebighi-ebi: zere ndi-orù-gi nrọ ahu, isi-ya ka ayi gākọ kwa.


Ma eze-nwanyi were n'ihi okwu nile nke eze na ndi-isi-ya bata n'ulo oké oriri ahu: eze-nwanyi zara, si, Eze, di ndu rue mb͕e nile ebighi-ebi; ka èchìchè-gi nile ghara ime ka i ma jijiji, ka ib͕u-maramara nke iru-gi ghara kwa ib͕anwe:


Mb͕e ahu Daniel gwara eze okwu, si, Eze, di ndu rue mb͕e ebighi-ebi.


Mb͕e ahu ndi-isi ndia na ndi nọchiri anya eze ndia were oké nkpọtu b͕akọta n'ebe eze nọ, ọ bu kwa otú a ka ha nāsi ya, Daraiọs, bú eze, di ndu rue mb͕e ebighi-ebi.


Ìgwè madu nile ndi nāga n'iru Ya, ndi nēso kwa, nēti nkpu, si, Hosanna diri Nwa Devid: Onye agọziri agọzi ka Onye ahu bu Nke nābia n'aha Onye-nwe-ayi; Hosanna n'ebe kachasi ihe nile elu.


Samuel we si ndi Israel nile, Ùnu ahuwo onye ahu nke Jehova rọputaworo, na ọ dighi onye di ka ya n'etiti ndi Israel nile? Ndi Israel nile we tie nkpu, si, Ka eze-ayi di ndu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan