Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 15:31 - Bible Nso

31 Otú onye we gosi Devid, si, Ahitofel di n'etiti ndi-nkekọta ahu ndi nēso Absalom. Devid we si, Biko, Jehova, me ka idu-ọdu Ahitofel ghọ ihe-nzuzu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

31 Mgbe a gwara Devid na Ahitofel onye na-adụ ya ọdụ dịnyere Absalọm, Devid kpere ekpere sị, “O Onyenwe anyị, biko, tụgharịa ndụmọdụ Ahitofel ka ọ bụrụ ndụmọdụ nzuzu.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 15:31
23 Iomraidhean Croise  

Absalom we zipu Ahitofel onye Gailo, bú onye nādu Devid ọdu, n'obodo-ya, bú Gailo mb͕e ọ nāchu àjà. Nkekọta ahu we di ike; ndi Israel nāba kwa uba nēje n'iru n'iru n'aka Absalom.


Ọdu Ahitofel, nke ọ duru na mb͕e ahu, di ka agāsi na ajuru ase n'okwu Chineke: otú a ka idu-ọdu nile nke Ahitofel di, ma n'ebe Devid nọ ma n'ebe Absalom nọ.


Absalom na ndikom nile nke Israel we si, Idu-ọdu Hushai, bú onye-Akait, di nma kari idu-ọdu Ahitofel, Ma Jehova nyere iwu imebi ezi idu-ọdu nke Ahitofel, ka Jehova we me ka ihe ọjọ biakwasi Absalom.


Ma Ahitofel huru na emeghi ihe ọ duru n'ọdu, o we jikwa inyinya-ibu-ya, bilie, la n'ulo-ya, rue obodo-ya, o we nye ulo-ya iwu, kwub͕u onwe-ya: o we nwua, elíe ya n'ílì nna-ya.


Absalom we si, Biko, kpọ kwa Hushai, bú onye-Akait, ka ayi nuru kwa ihe di kwa n'ọnu ya onwe-ya.


Hushai we si Absalom, Ọdu nke Ahitofel duworo ub͕u a adighi nma.


Ọ nēmebi èchìchè nile nke ndi-aghughọ, Aka-ha adighi-eme kwa ihe ha zubere.


Ha ewerewo kwa okwu ikpọ-asì b͕am buruburu, We busom agha n'efu.


Jehova, le otú ndi nākpab͕um bara uba! Ọtutu madu nēbili imegidem.


Ọbuná nwoke nke mu na ya di n'udo, onye m'tukwasiri obi, onye nēri nrim, Ọ mewo ikiri-ukwu-ya ka ọ di uku imegidem.


N'ehihie na abali ka ha nāb͕a ya buruburu n'elu mb͕idi-ya nile: Ma ajọ ihe ma nmeb͕u di n'etiti ya.


N'ihi na ọ bughi onye-iro nātam uta; M'gānagide kwa ya: Ọ bughi onye nākpọm asì mere onwe-ya uku megidem; M'gēzonari kwa ya onwem:


Ewe wusi mọ Ijipt n'etiti ya; ndum-ọdu-ya ka M'gēloda kwa: ha gāju kwa ihe-efu nile ha ase, ju kwa ndi-ntamu-ha, ju kwa ndi nāju mọ ihe, ju kwa ndi-dibia-afa.


abum Onye nēmebi ihe-iriba-ama nile nke ndi-ekwukwu, M'nēme kwa ka ndi nāju ase wi ara; abum Onye nēme ka ndi mara ihe laghachi azu, M'nēme kwa ka ihe-ọmuma-ha ghọ ihe-nzuzu:


Ekwughm okwu bayere unu nile: Mu onwem matara ndi M'rọputara: kama ọ bu ka emezu ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, Onye nēri nrim buliri ikiri-ukwu-ya imegidem.


Òle ebe onye mara ihe nọ? òle ebe ode-akwukwọ nọ? òle ebe onye oge a, onye ya na ibe-ya nājurita ajuju, nọ? Chìneke emeghi ka amam-ihe uwa buru ihe-nzuzu?


Amam-ihe a abughi amam-ihe nke nēsi n'elu ridata, kama ọ bu nke uwa, buru kwa nke nkpuru-obi madu nāchi, buru kwa ihe ndi-mọ ọjọ nēzí.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan