Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 15:30 - Bible Nso

30 Ma Devid nārigo na nrigo ugwu Olive, nārigo nākwa ákwá; ekpuchi-kwa-ra isi-ya, ya onwe-ya nēje kwa b͕ara ukwu efu: ndi nile ndi soro ya je kpuchi-kwa-ra, nwoke ọ bula isi-ya, ha we rigo, nārigo nākwa ákwá.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

30 Ma Devid na ndị so ya chere ihu irigo Ugwu Oliv. Mgbe ọ na-aga, Devid nọ na-akwa akwa. O yikwaghị ihe ọbụla nʼụkwụ ya, ma o ji ihe kpuchie isi ya. Ndị niile so ya kpuchikwara isi ha na-akwakwa akwa ka ha na-arịgo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 15:30
21 Iomraidhean Croise  

Zedok na Abaiata we bughachi ib͕e Chineke na Jerusalem: ha we nọdu n'ebe ahu.


Ma eze kpuchiri iru-ya, eze we tie nkpu n'oké olu, si, Nwam Absalom, Absalom, nwam, nwam!


Joab we bakuru eze n'ulo, si, I mewo ka ihere me iru ndi-orú-gi nile ta, bú ndi nēwepuga ndu-gi, na ndu umu-gi ndikom na nke umu-gi ndinyom, na ndu ndinyom-i, na ndu ndi-iko-gi nwayi, ta;


Mọdekai we laghachi n'ọnu-uzọ-ama eze. Ma Heman were ngwa la n'ulo-ya, nēru újú, ekpuchi-kwa-ra isi-ya.


Anya-mirim aghọworom nri ehihie na abali, Mb͕e ha nāsim ogologo ubọchi nile, Òle ebe Chineke-gi nọ?


Gini mere i ji ruda n'ala, nkpuru-obim? Gini mere i ji su ude nke-uku nimem? Chere Chineke: n'ihi na m'gēkele kwa Ya ọzọ, Onye bu nzọputa nke irum, na Chinekem.


Ze ume, debe ọnu-gi du; i gaghi-emere ndi nwuru anwu oruru-újú, ke ihe-ike-n'isi-gi n'onwe-gi, akpukpọ-ukwu-gi ka i gētiye kwa n'ukwu-gi abua, i gaghi-ekpuchi kwa eb͕ub͕ere-ọnu-elu-gi, i gaghi-eri kwa nri ndi ọzọ.


Ihe-ike-n'isi-unu gādi kwa unu n'isi, akpukpọ-ukwu-unu gādi kwa n'ukwu-unu: unu agaghi-eti aka n'obi, unu agaghi-akwa kwa ákwá; ma unu gāta aru n'ajọ omume nile unu, surita onwe-unu ude.


Ukwu-Ya abua gēguzo kwa n'ubọchi ahu n'elu ugwu Olive, nke di n'iru Jerusalem n'Iru-anyanwu, ugwu Olive gāb͕awa kwa n'etiti abua ya n'akuku Ọwuwa-anyanwu na n'akuku Ọdida-anyanwu, oké ndagwurugwu di uku ewe di; nkera ugwu ahu gāpuzuga n'akuku Ugwu, nkera-ya n'akuku Ndida.


Ngọzi nādiri ndi nēru újú: n'ihi na ndi ahu ka agākasì obi.


O rue, mb͕e Ọ biaruru Betfagi na Betani nso, n'uzọ ugwu anākpọ ugwu Olive, na O zigara madu abua n'etiti ndi nēso uzọ-Ya,


Ma mb͕e Ọ nābiaru Jerusalem nso ub͕u a, n'uzọ nrida nke ugwu Olive, ọra ndi nile nēso uzọ-Ya malitere iṅuri ọṅu na iwere oké olu to Chineke n'ihi ọlu nile di ike nke ha hururi;


Mb͕e Ọ biaruru Jerusalem nso, O we hu obodo ahu we kwara ya ákwá,


Kwa-ubọchi O nēzí ihe n'ulo uku Chineke; kwa-abali Ọ nāpu, nānọ ọnọdu-abali n'ugwu anākpọ ugwu Olive.


O we puta, ga ugwu Olive, dika Ọ nēme mb͕e dum; ndi nēso uzọ-Ya soro kwa Ya.


Mb͕e ahu ha siri n'ugwu anākpọ Olivet, nke di Jerusalem nso, ije nke otù ubọchi-izu-ike, laghachi na Jerusalem.


Nēsonu ndi nāṅuri n'iṅuri ọṅu; nēsonu ndi nākwa ákwá n'ikwa ákwá.


Ọ buru kwa na otù ihe nke di n'aru nāhu ahuhu, ihe nile di n'aru ahu soro ya nāhukọ ahuhu; ọ buru kwa na anēnye otù ihe di n'aru otuto, ihe nile di n'aru ahu soro ya ṅurikọ ọṅu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan