Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 15:3 - Bible Nso

3 Absalom we si ya, Le, okwu-gi nile di nma, zi kwa ezi; ma ọ dighi onye nēge gi nti site n'ebe eze nọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Absalọm na-agwa onye ahụ sị, “Ahụrụ m na okwu gị niile bụ eziokwu. Ma ọ na-ewute m na eze enweghị onye na-enyere ya aka ịnụ okwu ndị a niile.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 15:3
16 Iomraidhean Croise  

Absalom we si, Ònye gēdom onye-ikpe n'ala nka, ka nwoke ọ bula nke nwere okwu ma-ọbu ikpé we biakutem, m'we kpọ ya onye ezi omume!


Devid we buru eze Israel nile; Devid we nēmere ndi-ya nile ihe ekpere n'ikpe na ezi omume.


Ihe-efu ka ha nēkwurita, otù onye na ibe-ya: Eb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwu okwu ire-utọ na obi abua ka ha ji ekwu.


Sọpuru nna-gi na nne-gi: ka ubọchi-gi we di anya n'elu ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi.


Onye nākọcha nna-ya, ma-ọbu nne-ya, aghaghi ime ka ọ nwua.


Ezi madu gēnweputa n'aka Jehova na ihe-ya gātọ Ya utọ: Ma onye nzube ọjọ ka Ọ gāma ikpe.


Ọb͕ọ di nke nākọcha nna-ha, Ha adighi-agọzi kwa nne-ha.


Anya nke nākwa nna-ya emò, Nke nēleda kwa iṅa nne-ya nti, Ugolo-ọma nke ndagwurugwu gāghuputa ya, Umu-ugo gēri kwa ya.


Nna na nne ka ha lelìworo nime gi; ọbìa ka ha jiworo nmeb͕u emeso n'etiti gi: nwa-nb͕ei na nwanyi di-ya nwuru ka ha meworo ihe-ike nime gi.


Ma otù onye eledara anya gēguzo ọtọ n'ọnọdu-ya, onye ha nātukwasighi ebube nke ala-eze: ma ọ gābata nime na mb͕e udo, were ire-utọ nile nata ala-eze ahu.


ha we kpọkọta onwe-ha imegide Moses na imegide Eron, si ha, O zuworo unu, n'ihi na nzukọ Israel nile, ha nile n'otù n'otù, di nsọ, ọ bu kwa n'etiti ha ka Jehova nọ: ọ̀ bu kwa gini mere unu nēbuli onwe-unu kari nkpọkọta nke Jehova?


N'ihi na Chineke siri, Sọpuru nna-gi na nne-gi: na, Onye kwujọrọ nna maọbu nne, ya nwua ọnwu ahu.


Pọl we si, Amataghm, umu-nnem, na ọ bu onye-isi-nchu-àjà: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ekwula okwu ọjọ megide onye-isi ọ bula nke ndi nke gi.


Sọpurunu madu nile. Hunu òtù ndi bu umu-nna n'anya. Nātunu egwu Chineke. Nāsọpurunu eze-unu.


ma nke kachasi ndi nējeso anu-aru n'agu ihe emeruru emeru, ndi nēlelì kwa ibu-onye-nwe-madu anya. Ndi nwere anya-ike, ndi nwere isi-ike, ha amaghi aru jijiji ikwulu ndi nọ n'ebube:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan