Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 15:25 - Bible Nso

25 Eze we si Zedok Bughachi ib͕e Chineke n'obodo; o buru na ahutam amara n'iru Jehova, Ọ gēweghachim, me ka m'hu ya na ebe-obibi-Ya:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

25 Mgbe ahụ, eze sịrị Zadọk, “Bughachi igbe Chineke a nʼime obodo. Ọ bụrụ na m ahụta amara nʼanya Onyenwe anyị, ọ ga-akpọghachi m mee ka m hụ ya, na ebe obibi ya anya ọzọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 15:25
19 Iomraidhean Croise  

Ha we bubata ib͕e Jehova, guzo ya n'ọnọdu-ya, n'etiti ulo-ikwū nke Devid mara nye ya: Devid we sure àjà-nsure-ọku na àjà-udo n'iru Jehova.


na eze siri Netan, bú onye-amuma, Biko, le, Mu onwem nēbi n'ulo cedar, ma ib͕e Chineke nēbi n'etiti ákwà-nkwuba.


Aṅuririm ọṅu mb͕e ha nāsim, Ka ayi je n'ulo Jehova.


N'ihi ulo Jehova, bú Chineke-ayi, M'gāchọrọ gi ọdi-nma.


Jehova, ahuwom ebe-obibi nke ulo-gi n'anya, Ya na ọnọdu nke ebe-obibi nke ebube-Gi.


N'ihi na otù ubọchi n'ogige-Gi nile di nma kari nnù ubọchi abua na ọgu iri n'ebe ọzọ. Arọputawom iguzo na nbata-uzọ n'ulo Chinekem, Kari ibi n'ulo-ikwū nile nke nmebi-iwu.


N'ebere-Gi ka I duworo ndi nke I b͕aputaworo: N'ike-Gi ka I duworo ha nwayọ rue ebe-obibi-Gi di nsọ.


Moses we si Jehova, Le, Gi onwe-gi nāsim, Me ka ndi nka rigota: ma Gi onwe-gi emeghi ka M'mara onye I gēziga ka mu na ya yikọ je. Ma Gi onwe-gi asiwo, Amawom i n'aha, ọzọ kwa, i hutawo amara n'irum.


Ma ub͕u a, biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru Gi, biko, mem ka m'mara uzọ-Gi nile, m'gāmara kwa Gi, ka m'we huta amara n'iru Gi: Gi le kwa na ndi-Gi ka mba nka bu.


Hezekaia we si, Gini gābu ihe-iriba-ama na m'gārigoru ulo Jehova n'ubọchi nke-atọ?


Ma gi onwe-gi gēburu ha amuma okwu nile ndia, si ha Jehova gēsi n'elu bib͕ọ, si kwa n'ebe-obibi-Ya di nsọ me ka olu-Ya da udà; Ọ gēbib͕osi ebe-ita-nri-Ya ike; nkpu dika ndi nāzọcha nkpuru-vine ka Ọ gēti imegide ndi nile bi n'uwa.


Unu atukwasila obi-unu n'okwu-ugha nile, si, Ulo uku Jehova, ulo uku Jehova, ulo uku Jehova, ka ndi a bu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan