Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 15:20 - Bible Nso

20 nyahuru bu ọbibia-gi, ọ̀ bu ta ka m'gēme gi ka i ṅagharia n'iso ayi je, n'ihi na mu onwem nēje ebe mu onwem nēje? gi laghachi, me kwa ka umu-nne-gi laghachi; ka ebere na ezi-okwu diyere gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 Ọ dịbeghị anya kemgbe ị bịara. M ga-esi aṅaa kwere ka i soro m na-awagharị, ebe ọ bụ na m amaghị ebe m na-aga. Chịrị ndị agha gị laghachi. Ka obiọma na ikwesi ntụkwasị obi dịnyere unu.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 15:20
17 Iomraidhean Croise  

Devid we zigara ndikom Jebesh-gilead ndi-ozi, si, ha, Ndi agọziri agọzi diri Jehova ka unu bu, na unu emeworo onye-nwe-unu, bú Sọl, ebere a, unu we líe-ya.


Ma ub͕u a Jehova mere unu ebere na ezi-okwu: ọzọ kwa, mu onwem gēmeghachiri unu ezi ihe a, n'ihi na unu emewo ihe a.


Okporo-uzọ nile nke Jehova bu ebere na ezi-okwu N'ebe ndi nēchezi ọb͕ub͕a-ndu-Ya na ihe-àmà-Ya nile nọ.


Nwagharim ka Gi onwe-gi guworo ọnu: Tiye anya-mirim nile nime karama-akpukpọ-Gi; Hà adighi n'akwukwọ-Gi:


O gēsi n'elu-igwe zìe, zọputam, Mb͕e onye nēkusi ume ike ilom nāta uta; Selah Chineke gēziputa ebere-Ya na ezi-okwu-Ya.


Ndi ahu nāṅaghari iri ihe, Ọ buru na afọ ejughi ha ha gānọ kwa ọnọdu-abali.


O gēbi n'iru Chineke rue mb͕e ebighi-ebi: Wezuga ebere na ezi-okwu, ka ha we nēchezi ya.


Otú a m'gābùku aha-Gi abù ọma rue mb͕e ebighi-ebi, Ka m'we kwughachi nkwam nile kwa-ubọchi.


Ebere na ezi-okwu ezutewo; Ezi omume na udo esutuwo ọnu.


Ezi omume na ikpe ziri ezi bu ọnọdu guzosiri ike nke oche-eze-Gi: Ebere na ezi-okwu nāga n'iru Gi.


Hà adighi-akpafu, bú ndi nēchèputa ihe ọjọ? Ma ebere na ezi-okwu gādiri ndi nēchèputa ezi ihe.


Ekwela ka ebere na ezi-okwu rapu gi: Ke ha n'olu-gi; De ha n'elu mbadamba nkume, bú obi-gi:


Ha gāṅaghari kwa site n'otù oké osimiri rue oké osimiri ọzọ, site kwa n'Ugwu we rue n'Ọwuwa-anyanwu; ha gāb͕aghari iru na azu ichọ okwu Jehova, ma ha agaghi-achọta ya.


N'ihi na esitere n'aka Moses nye iwu Chineke; amara na ezi-okwu sitere n'aka Jisus Kraist bia.


Devid na ndikom-ya, ihe ra ka nnù ndikom na ọgu iri, we bilie, si na Keila pua, ha we nējeghari ebe ha huru uzọ ijeghari. Ewe gosi Sọl na Devid esiwo na Keila wepuga onwe-ya; o we ghara iputa.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan