Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 15:18 - Bible Nso

18 Ndi-orù-ya nile we nāgabiga n'akuku ya; ndi Keret nile, na ndi Pelet nile, na ndi Gat nile, bú nnù ndikom na ọgu iri ndi siri na Gat bia, soro ya n'ukwu n'ukwu, nāgabiga kwa n'iru eze.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 Ndị niile na-ejere ya ozi, gafere nʼakụkụ ya, ha na ndị Keret na Pelet, na narị ndị ikom isii ndị Git, bụ ndị so ya site na Gat, gafekwara nọrọ nʼihu eze.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 15:18
16 Iomraidhean Croise  

Eze we pua, ya na ndi-ya nile ndi soro ya n'ukwu n'ukwu; ha we nọdu na Bet-meahak.


Devid we zipu ndi ahu, otù uzọ n'uzọ atọ n'aka Joab, na otù uzọ n'uzọ atọ n'aka Abishai nwa Zeruaia, nwa-nne Joab, na otù uzọ n'uzọ atọ n'aka Itai, bú onye Gat Eze we si ndi-ya, Aghaghm iso unu pua, ọbuná mu onwem.


Ma Joab bu onye-isi usu-ndi-agha nile nke Israel: Benaia nwa Jehoiada bu onye-isi ndi Keret, bu kwa onye-isi ndi Pelet:


Ndikom Joab we soro ya pua, ha na ndi Keret na ndi Pelet, na ndi-dike nile: ha we si na Jerusalem pua, ichu Sheba nwa Bikri n'azu.


Devid ekweghi kwa iwezugara onwe-ya ib͕e Jehova rue obodo Devid; ma Devid buzugara ya rue ulo Obed-edom, bú onye Gat.


Benaia nwa Jehoiada bu onye-isi ndi Keret na ndi Pelet; umu-ndikom Devid bu ndi-isi n'ije ozi.


Zedok, bú onye-nchu-àjà, na Netan, bú onye-amuma, na Benaia nwa Jehoiada, na ndi Keret na ndi Pelet, we rida, me ka Solomon nọkwasi n'inyinya mule nke eze, bú Devid, me ka o jerue Gaihon.


Benaia nwa Jehoiada bu onye-isi ndi Keret na ndi Pelet; umu-ndikom Devid bu ndi-isi n'aka eze.


Devid na ndikom-ya, ihe ra ka nnù ndikom na ọgu iri, we bilie, si na Keila pua, ha we nējeghari ebe ha huru uzọ ijeghari. Ewe gosi Sọl na Devid esiwo na Keila wepuga onwe-ya; o we ghara iputa.


Devid we si ndikom-ya, Kenu, nwoke ọ bula mma-agha-ya n'úkwù-ya. Ha we ke, nwoke ọ bula mma-agha-ya, n'úkwù; Devid we ke kwa mma-agha-ya n'úkwù: ihe ra ka nnù ndikom we soro Devid n'azu rigo; ọgu ndikom iri we nọdu n'ebe ihe-ha di.


Devid we biri n'aka Ekish na Gat, ya onwe-ya na ndikom-ya, nwoke ọ bula na ulo-ya, bú Devid na ndinyom-ya abua, Ahinoam nwayi Jezreel, na Abigail nwayi Kamel, bú nwunye Nebal.


Ewe gosi Sọl na Devid ab͕alagawo rue Gat: o we ghara ichọ ya ọzọ ma-ọli.


O rue, mb͕e Devid na ndikom-ya biaruru Ziklag n'ubọchi nke-atọ, na ndi Amalek amadewo na Negeb, made kwa na Ziklag, ha etib͕uwo kwa Ziklag, sure ya n'ọku,


Ayi onwe-ayi madere na Negeb nke ndi Keret, made kwa n'ala nke Juda nwere, made kwa na Negeb nke Keleb; ayi we sure Ziklag n'ọku.


Devid we je, ya onwe-ya na nnù ndikom na ọgu iri ndi soro ya, ọ biarue miri-iyi Besoa, ma ndi anārapu n'azu guzoro n'ebe ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan