Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 15:12 - Bible Nso

12 Absalom we zipu Ahitofel onye Gailo, bú onye nādu Devid ọdu, n'obodo-ya, bú Gailo mb͕e ọ nāchu àjà. Nkekọta ahu we di ike; ndi Israel nāba kwa uba nēje n'iru n'iru n'aka Absalom.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Mgbe Absalọm nọkwa na-achụ aja ahụ, o ziri ozi ka a kpọọ Ahitofel onye Gailo, otu nʼime ndị na-adụ Devid ọdụ, ka o si Gailo bịa nke bụ obodo ya. Nke a mere ka nkwekọrịta nzuzo ọjọọ ahụ na-esi ike karịa, ndị dịnyere Absalọm na-amụbanyekwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 15:12
26 Iomraidhean Croise  

Otú onye we gosi Devid, si, Ahitofel di n'etiti ndi-nkekọta ahu ndi nēso Absalom. Devid we si, Biko, Jehova, me ka idu-ọdu Ahitofel ghọ ihe-nzuzu.


Absalom na ndi nile, bú ndikom Israel, we ba na Jerusalem, Ahitofel so-kwa-ra ya ba.


Absalom na ndikom nile nke Israel we si, Idu-ọdu Hushai, bú onye-Akait, di nma kari idu-ọdu Ahitofel, Ma Jehova nyere iwu imebi ezi idu-ọdu nke Ahitofel, ka Jehova we me ka ihe ọjọ biakwasi Absalom.


Ma Ahitofel huru na emeghi ihe ọ duru n'ọdu, o we jikwa inyinya-ibu-ya, bilie, la n'ulo-ya, rue obodo-ya, o we nye ulo-ya iwu, kwub͕u onwe-ya: o we nwua, elíe ya n'ílì nna-ya.


Elifelet nwa Ahasbai, nwa onye Meakat, Eliam nwa Ahitofel onye Gailo;


Ha kpọsara obubu-ọnu, me ka Nebot nọdu n'isi ọnọdu n'etiti ndi Israel.


O we de n'akwukwọ ahu, si, Kpọsanu obu-bu-ọnu, me ka Nebot nọdu n'isi ọnọdu n'etiti ndi Israel:


Ahitofel bu kwa onye nādu eze ọdu: Hushai onye-Akait bu eyì eze:


Ma Gi onwe-gi, Jehova, merem amara, me ka m'bilie, Ka m'we kwughachi ha ugwọ.


Ọbuná nwoke nke mu na ya di n'udo, onye m'tukwasiri obi, onye nēri nrim, Ọ mewo ikiri-ukwu-ya ka ọ di uku imegidem.


Àjà ndi nēmebi iwu bu ihe-árú n'anya Jehova: Ma ekpere ndi ziri ezi bu ihe nātọ Ya utọ.


Àjà nke ndi nēmebi iwu bu ihe-árú: O gēsi kwa aṅa ghara ibu ihe-árú kari, mb͕e o ji nzube ọjọ weta ya?


N'ìhi gini kwa ka frankincense ji biakutem site na Sheba, calamus ọma kwa site n'ala di anya? àjà-nsure-ọku-unu, ha abughi ihe natọ utọ, àjà-unu kwa, ha atọghm utọ.


Belam we si Belak, Wuerem ebe-ichu-àjà asa n'ebe a, dozi-kwa-ram oke-ehi asa na ebulu asa n'ebe a.


Ọ we kuru ya je ọhia Zofim, rue elu Pisga, o wue ebe-ichu-àjà asa, sure otù oke-ehi na otù ebulu ọku n'ebe-ichu-àjà ọ bula.


Belak we me dika Belam siri, ọ we sure otù oke-ehi na otù ebulu n'ebe-ichu-aja ọ bula.


Ekwughm okwu bayere unu nile: Mu onwem matara ndi M'rọputara: kama ọ bu ka emezu ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, Onye nēri nrim buliri ikiri-ukwu-ya imegidem.


Ha nēkwuputa na ha matara Chineke; ma ọlu nile ha ka ha ji gọnari Ya, ebe ha bu ihe-ùrú, ndi nādighi-ekwenye kwa, buru kwa ndi ajuru aju n'ebe ezi ọlu nile ọ bula di.


na Goshen, na Holon, na Gailo; obodo iri na otù na obodo ntà ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan