Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 15:1 - Bible Nso

1 O rue, mb͕e nka gasiri, na Absalom doziri onwe-ya ub͕ọ-ala na inyinya, na ọgu ndikom abua na iri ndi nāb͕a ọsọ n'iru ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Mgbe nke a gasịrị, Absalọm zụtaara onwe ya ụgbọ agha na ịnyịnya na-adọkpụ ya. O nwetakwaara onwe ya iri ndị ikom ise ndị na-agba ọsọ nʼihu ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 15:1
11 Iomraidhean Croise  

Otú a ka Jehova siri, Le, M'nēme ka ihe ọjọ si n'ulo-gi bilie imegide i, M'gāchiri kwa ndinyom-i n'anya-gi nye ibe-gi, ọ gēso kwa ndinyom-i dina n'anya anyanwu a.


Eze we si ha, Chirinu ndi-orù onye-nwe-unu tiyere onwe-unu, me ka Solomon, bú nwam, nọkwasi n'inyinya mule nke m'nwere, me-kwa-nu ka ọ ridarue Gaihon:


Ma Adonaija nwa Hagit nēweli onwe-ya elu, si, Mu onwem gābu eze: o we doziere onwe-ya ub͕ọ-ala, na ndi-inyinya, na ọgu ndikom abua na iri ndi nāb͕a ọsọ n'iru ya.


Ufọdu nēhota ub͕o-ala, ndi ọzọ inyinya: Ma ayi onwe-ayi nēhota aha Jehova, bú Chineke-ayi.


Nganga bia, nlelì abia kwa: Ma n'ebe ndi di ume-ala n'obi nọ ka amam-ihe di.


N'iru ntipia ka npako nāga, Ọ bu kwa n'iru isu-ngọngọ ka idi-elu nke mọ madu nāga.


Onye nāhu njehie n'anya nāhu ilu-ọ̀gù n'anya: Onye nēme ka ọnu-uzọ-ya di elu nāchọ ntipia.


Nání na ọ gaghi-eme ka inyinya bara ya uba, ọ gaghi-eme kwa ndi Israel ka ha laghachi n'Ijipt, ka o we me ka inyinya ba uba: n'ihi na Jehova asiwo unu, Unu alaghachi-kwa-la n'uzọ ahu ọzọ.


O we si, Nka gābu ikpé eze ahu nke gābu eze-unu: umu-unu ndikom ka ọ gāchiri, doro ha onwe-ya n'ub͕ọ-ala-ya na n'elu inyinya-ya; ha gānab͕a kwa ọsọ n'iru ub͕ọ-ala-ya:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan