Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 14:3 - Bible Nso

3 i gābakuru kwa eze, gwa ya okwu dika okwu a si di. Joab we tiye okwu n'ọnu-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Emesịa, jekwuru eze, gwa ya okwu ndị a m na-agwa gị.” Joab tinyere okwu ndị ahụ nʼọnụ ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 14:3
9 Iomraidhean Croise  

Eze we si, Àka Joab diyere gi n'ihe a nile? Nwayi ahu we za, si, Ndu nke nkpuru-obi-gi, onye-nwem, bú eze, ọ dighi onye ọ bula nēsi n'ihe ọ bula onye nwem, bú eze, kwuru, che iru n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe: n'ihi na orù-gi, bú Joab, ya onwe-ya nyerem iwu, ya onwe-ya tiye-kwa-ra okwu ndia nile n'ọnu nwayi nējere gi ozi:


Nwayi Tekoa we gwa eze okwu, da kpue iru-ya n'ala, kpọ isi ala, si, Zọputam eze.


M'we nye ha iwu inye Ido, bú onye-isi na Kasifia, bú ebe ahu; m'we tiye n'ọnu-ha okwu igwa Ido, bú nwa-nne-ya, na Netinim, nime Kasifia, bú ebe ahu, ka ha me ka ndi nējere ulo Chineke-ayi ozi biakute ayi.


I gāgwa kwa ya okwu, tiye okwu ndia n'ọnu-ya: Mu onwem gānọye-kwa-ra ọnu-gi, nọye-kwa-ra ọnu-ya, zí kwa unu ihe ahu unu gēme.


M'we tiye okwum nile n'ọnu-gi, ọ bu kwa na ǹdò akam ka M'kpuchiworo gi, iku elu-igwe dika ihe-ọkukú, na itọ ntọ-ala nke uwa, na isi Zaion, Ndim ka i bu.


Ma Mu onwem, nka bu ọb͕ub͕a-ndum nke di n'etiti Mu na ha, ka Jehova siri: Mọm nke di n'aru gi, na okwum nile nke M'tiyeworo n'ọnu-gi, agaghi-apu n'ọnu-gi, na n'ọnu nkpuru-gi, na n'ọnu nkpuru nke nkpuru-gi, ka Jehova siri, site n'ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi.


Jehova we setipu aka-Ya, me ka o rutu ọnum: Jehova we sim, Le, etinyewom okwum nile n'ọnu-gi:


Jehova we tiye okwu n'ọnu Belam, si, Jeghachikuru Belak, ọ bu kwa otú a ka i gēkwu.


M'gēme ka onye-amuma, nke di ka gi, biliere ha site n'etiti umu-nne-ha; M'gētiye kwa okwum nile n'ọnu-ya, ọ gāgwa kwa ha okwu nile nke M'gēnye ya n'iwu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan