Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 14:22 - Bible Nso

22 Joab we da kpue iru-ya n'ala, kpọ isi ala, gọzie eze: Joab we si, Ta ka orù-gi mara na ahutawom amara n'iru-gi, onye-nwem, bú eze, ebe eze meworo okwu orù-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 Joab dara nʼala kpuo ihu ya nʼala, kpọọ isiala, gọzie eze. Joab sịrị, “Taa ka ohu gị maara na ahụtala m amara nʼihu gị, onyenwe m bụ eze, nʼihi na eze e merela ohu ya ihe ọ rịọrọ.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 14:22
13 Iomraidhean Croise  

Josef we me ka Jekob nna-ya bata, o guzo ya n'iru Fero: Jekob we gọzie Fero.


Ma Noa hutara amara n'iru Jehova.


Eze we si Joab, Biko, le emewom ihe a: gi je kwa, me ka nwa-okorọbia ahu, bú Absalom, lata.


Joab we bilie je Geshua, me ka Absalom bia ba na Jerusalem.


Nwayi Tekoa we gwa eze okwu, da kpue iru-ya n'ala, kpọ isi ala, si, Zọputam eze.


Ndi Devid nile we gabiga Jọdan, eze gabiga-kwa-ra: eze we sutu Bazilai ọnu, gọzie ya: o we laghachi n'ebe-ya.


Ndi-Ju we gọzie ndikom ahu nile ndi were afọ-ofufo nye onwe-ha ibi na Jerusalem.


N'ihi na nti nurum, we kpọm onye ihe nāgara nke-ọma; Anya hu-kwa-ram, we b͕aram àmà:


Ọ buru na úkwù-ya agọzighm, Ọ buru kwa na esiteghi n'aji aturum me ka aru di ya ọku;


Umu-ya ebiliwo, kpọ ya nwayi ihe nāgara nke-ọma; Di-ya kwa, o nēto kwa ya, si:


Rut, b/u nwayi Moab, we si Naomi, Biko, ka m>je n>ubi, chikọta ihe n>etiti oko ọka n>azu onye m>g=ahuta amara n>iru ya. _O si ya, Je, nwam.


Devid we ṅua iyi ọzọ, si, Nna-gi amawo nke-ọma na ahutawom amara n'iru gi; o we si, Ka Jonatan ghara ima nka, ka o we ghara iwuta ya: ma otú ọ di, Jehova nādi ndu, nkpuru-obi-gi nādi kwa ndu, nání ihe ra ka otù nzọ-ukwu di n'ab͕ata mu na ọnwu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan