Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 14:19 - Bible Nso

19 Eze we si, Àka Joab diyere gi n'ihe a nile? Nwayi ahu we za, si, Ndu nke nkpuru-obi-gi, onye-nwem, bú eze, ọ dighi onye ọ bula nēsi n'ihe ọ bula onye nwem, bú eze, kwuru, che iru n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe: n'ihi na orù-gi, bú Joab, ya onwe-ya nyerem iwu, ya onwe-ya tiye-kwa-ra okwu ndia nile n'ọnu nwayi nējere gi ozi:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 Devid jụrụ ya sị, “Aka Joab ọ dị nʼokwu ndị a niile?” Nwanyị ahụ zara sị ya, “Dịka ị na-adị ndụ, onyenwe m, bụ eze, ọ dịghị onye ọbụla ga-esi nʼihe onyenwe m bụ eze kwuru, chee ihu nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe. E, ọ bụ ohu gị Joab nyere m iwu ime nke a, ya gwakwara ohu gị nwanyị okwu niile ndị a.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 14:19
22 Iomraidhean Croise  

Uraia we si Devid, Ib͕e Chineke, na Israel, na Juda, nānọdu n'ulo-ntu; onye-nwem Joab na ndi-orù onye-nwem nānọ kwa n'ulo-ikwū n'ọhia; ma mu onwem, m'gābà n'ulom, iri ihe na iṅu ihe-ọṅuṅu, na isoro nwunyem dina? ndu-gi, na ndu nkpuru-obi-gi, ma ọ buru na emem ihe a.


Eze we za, si nwayi ahu, Biko, ezonarilam okwu nke mu onwem nāju gi. Nwayi ahu we si, Biko, ka onye-nwem, bú eze, kwue.


i gābakuru kwa eze, gwa ya okwu dika okwu a si di. Joab we tiye okwu n'ọnu-ya.


Ma asi na emem otú a, m'gēme ihe-ugha megide ndum, (ma ọ dighi okwu ọ bula agēzonari eze,) gi onwe-gi gēguzo kwa onwe-gi n'akuku ọzọ.


Abnea we laghachi rue Hebron, Joab we wezuga ya n'etiti ọnu-uzọ-ama ikpayere ya uka na nwayọ, o we tie ya n'okpuru ọgiriga-ya nke-ise n'ebe ahu, o we nwua n'ihi ọbara Asahel, bú nwa-nne-ya.


ka ọ dakwasi n'isi Joab, na n'ulo nna-ya nile; ka aghara kwa ibipu n'ulo Joab onye nwere orùrù n'anu-aru-ya, ma-ọbu onye-ekpenta, ma-ọbu onye nādabere na nkpa-n'aka, ma-ọbu onye nāda site na mma-agha, ma-ọbu onye nri kọrọ.


Ekeghi aka-gi abua ab͕u, emeghi kwa ka ukwu-gi abua biarue nso ihe ọla eji ke ukwu ab͕u: Dika onye nāda n'iru ndi ajọ omume, otú a ka i dara. Ndi Israel nile we kwara ya ákwá ọzọ.


Elaija we si Elaisha, Biko, nọdu n'ebe a; n'ihi na Jehova ezigawom ijeru Bet-el, Elaisha we si, Jehova nādi ndu, nkpuru-obi-gi nādi kwa ndu, m'gaghi-arapu gi ma-ọli. Ha we ridarue Bet-el.


I gāgwa kwa ya okwu, tiye okwu ndia n'ọnu-ya: Mu onwem gānọye-kwa-ra ọnu-gi, nọye-kwa-ra ọnu-ya, zí kwa unu ihe ahu unu gēme.


Ọ bu nsọpuru Chineke izobe okwu: Ma nsọpuru ndi-eze bu igwuputa ala okwu.


Ewezugala onwe-gi n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe: Si n'ihe ọjọ wezuga ukwu-gi.


biko, ka ayi gabiga nime ala-gi: ayi agaghi-agabiga nime ọhia ma-ọbu nime ubi-vine, ayi agaghi-aṅu kwa miri olùlù: n'uzọ eze ka ayi ganēje, ayi agaghi-ewezuga onwe-ayi n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe, rue mb͕e ayi gāgabiga ókè-ala-gi.


n'ihi na Mu onwem gēnye unu ọnu na amam-ihe, nke ndi nile nēmegide unu nāgaghi-apu iguzogide ma-ọbu ikwugide okwu.


ma ewezugala onwe-gi n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe n'okwu nile ọ bula nke mu onwem nēnye unu n'iwu ta, ijeso chi di iche iche ọzọ ifè ha òfùfè.


Unu gēlezi kwa anya ime dika Jehova, bú Chineke-unu, nyeworo unu iwu: unu ewezugala onwe-unu n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe.


Nání, di ike, nwe kwa ume nke-uku, ilezi anya ime dika iwu ahu nile si di, nke Moses, bú orùm, nyere gi n'iwu: ewezugala onwe-gi na ya n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe, ka i we nwe uche n'ebe ọ bula i nēje.


Hana we si, Biko, onyenwe m, nkpuru-obi-gi nādi ndu, onyenwe m, Mu onwem bu nwayi ahu nke guzoro onwe-ya nso gi n'ebe a, ikpere Jehova.


Ma mb͕e Sọl huru Devid ka ọ nāpu izute onye Filistia ahu, ọ siri Abnea, bú onye-isi usu-ndi-agha-ya, Abnea, nwà onye ka nwa-okoro nka bu? Abnea we si, Nkpuru-obi-gi nādi ndu, eze, amaghm.


Devid we ṅua iyi ọzọ, si, Nna-gi amawo nke-ọma na ahutawom amara n'iru gi; o we si, Ka Jonatan ghara ima nka, ka o we ghara iwuta ya: ma otú ọ di, Jehova nādi ndu, nkpuru-obi-gi nādi kwa ndu, nání ihe ra ka otù nzọ-ukwu di n'ab͕ata mu na ọnwu.


Ma ub͕u a, onye-nwem, Jehova nādi ndu, nkpuru-obi-gi nādi kwa ndu, ebe Jehova b͕ochiworo gi ka i ghara ibà n'ikpe-ọmuma ọbara, ka aka-gi ghara kwa izọputa gi, ub͕u a kwa ka ndi-iro-gi na ndi nāchọ ime onye-nwem ihe ọjọ di ka Nebal.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan