Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 14:17 - Bible Nso

17 Nwayi nējere gi ozi we si, Biko, ka okwu onye-nwem, bú eze, diri izu-ike: n'ihi na dika mọ-ozi nke Chineke, otú a ka onye-nwem, bú eze, di inu ezi ihe na ihe ọjọ: Jehova, bú Chineke-gi, nọyere gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

17 “Ugbu a, ohu gị nwanyị na-asị, ‘Ka okwu onyenwe m eze kwuru wetara m izuike, nʼihi onyenwe m eze na-enyochapụta ihe ọma maọbụ ihe ọjọọ dịka mmụọ ozi Chineke. Ka Onyenwe anyị Chineke gị nọnyere gị.’ ”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 14:17
13 Iomraidhean Croise  

Eze we za, si nwayi ahu, Biko, ezonarilam okwu nke mu onwem nāju gi. Nwayi ahu we si, Biko, ka onye-nwem, bú eze, kwue.


ọ bu ichighari iru okwu a ka Joab, bú orù-gi meworo ihe a: ma onye-nwem bu onye mara ihe, dika amam-ihe nke mọ-ozi nke Chineke, ima ihe nile di n'uwa.


O we kwulu orù-gi n'ebe onye-nwem, bú eze, nọ; ma onye-nwem, bú eze, di ka onye-ozi Chineke: gi me kwa ihe di nma n'anya-gi.


N'ihi na ulo nnam nile abughi ihe ọ bula ma-ọbughi ndi ọnwu n'iru onye-nwem, bú eze: ma i doro orù-gi n'etiti ndi nēri ihe na table nke gi. Ma èzi omume gini ka m'nwere ọzọ itiku eze nkpu ọzọ?


Israel nile we nu ikpe eze kpere; ha we tua egwu eze: n'ihi na ha huru na amam-ihe Chineke di nime ya, ime ihe ekpere n'ikpe.


Ma nye orù-Gi obi nānu ihe ikpe ndi-Gi ikpe, ighọta ihe di iche n'etiti ezi ihe na ihe ọjọ; n'ihi na ònye puru ikpe ndi-Gi nka di arọ́ ikpe?


Ọ̀ di ajọ omume di n'irem? Òkpo-ọnum agaghi-amata ihe anāchọsi ike?


Ite eji anucha ihe diri ọla-ọcha, oké ọku di-kwa-ra ọla-edo, Anānwa kwa onye ọ bula site n'otuto-ya.


Nwoke nke nāgwa madu-ibe-ya okwu ire-utọ Nāb͕asara nzọ-ukwu-ya nile ub͕u.


Ma nri siri ike bu nke ndi tozuru okè, ndi anwaworo nghọta-ha n'ihi omume ha nēme mb͕e dum itule ihe ọma na ihe ọjọ.


Dika ihe nile si di nke ayi gere Moses nti nime ya, otú a ka ayi gēge gi nti: nání, Jehova, bú Chineke-gi, nọyere gi, dika Ọ nọyere Moses.


Ekish we za, si Devid, Amawom na onye di nma n'anyam ka i bu, dika mọ-ozi Chineke: ọ bu nání na ndi-isi Filistia asiwo, Ọ gaghi-eso ayi rigo n'agha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan