Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 14:14 - Bible Nso

14 N'ihi na ayi aghaghi inwu, ayi di kwa ka miri nke anāwusi n'ala, nke anāgaghi-achikọta; ma Chineke ewepughi ndu, kama Ọ nēchè èchìchè, ka onye achupuru achupu we ghara ibu onye achupuru n'ebe Ọ nọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Anyị niile ga-anwụ. Anyị dịkwa ka mmiri a wụsara nʼala, nke a na-apụghị ịchịkọtakwa ọzọ. Ma Chineke adịghị anapụ mmadụ ndụ ya, ma ọ na-emeghepụ ụzọ ga-eme ka onye ọ chụpụrụ achụpụ lọghachikwutekwa ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 14:14
31 Iomraidhean Croise  

Devid we si onye-ozi ahu, Otú a ka i gāsi Joab, Ka ihe a ghara ijọ njọ n'anya-gi, n'ihi na mma-agha nēripia otù onye dika ọ nēripa onye ọzọ: me ka agha-gi di ike megide obodo ahu, kwadà ya: gi me kwa ka ọ di ike.


Ma ub͕u a, ebe m'biaworo igwa eze, bú onye nwem, okwu a, ọ bu n'ihi na ndim emewo ka m'tua egwu; nwayi nējere gi ozi we si, Biko, ka m'gwa eze okwu; eleghi anya eze gēme okwu nke orù-ya nwayi.


M'gēweda kwa nkpuru Devid n'ihi nka, ma ọ bughi ubọchi nile.


Ọ buru na madu anwua, ọ̀ gadi ndu ọzọ? Ubọchi nile nke obubu-agham ka m'gēche, Rue mb͕e nb͕anwem gābia.


N'ihi na amawom na ọ bu ọnwu ka I gēmem ka m'chigharikuru, Ru kwa ulo nzute nke diri ihe nile di ndu.


Anu-aru nile gēkubìkọ ume, Mdu gālaghachi kwa n'ájá.


Àgāsi kwa Ya otú a, bú Onye nādighi-ahu ndi-isi iru-ọma, Nke nādighi-amata kwa ọgaranya kari onye nēnweghi ike? N'ihi na ọlu nke aka-Ya ka ha nile bu.


Dika miri ka awusiworom, Ọkpukpum nile ekesawo onwe-ha: Obim aghọwo ihe dika wax; Ọ lọwo miri n'etiti afọm.


Ikem akpọwo nku di ka osisi; Irem nārapara kwa n'ab͕am; Ọ bu kwa n'ájá ọnwu ka I nātọb͕ọm.


Ka ha b͕aze dika miri nke nērùghariri onwe-ya: Mb͕e o nēdo àkú-ya nile, ka ha di ka anēbipu ọnu-ha.


Ọ̀ bu rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya gwuchapuworo? Ọ̀ gwusiwo, bú okwu-Ya, rue ọb͕ọ nile?


Ha awusiwo ọbara-ha dika miri buruburu Jerusalem; Ọ dighi kwa onye ọ bula ṅēli ozu-ha.


Ubọchi arọ nile ayi di ọgu arọ atọ na iri; Ma ọ buru na ha esite n'idi-ike-ayi rue ọgu arọ anọ, Otú ọ di, nganga-ha bu nání idọb͕u-onwe-ha-n'ọlu na ajọ ihe; N'ihi na ọ b͕apuwo ọsọsọ, ayi we fela dika nnunu.


I nēme ka madu laghachi n'ájá; I we si, Laghachinu, umu madu.


Ma onye nēcheghi anwu, ma Chineke mere ka ọ dabà n'aka-ya; M'gēdoro gi ebe ọ gāb͕alaga.


N'ihi na ndi di ndu mara na ha gānwu: ma ndi nwuru anwu adighi-ama ihe ọ bula, ọ dighi kwa ugwọ-ọlu ha nwere ọzọ; n'ihi na echezọwo ncheta-ha.


N'ihi na Onye-nwe-ayi agaghi-aju rue mb͕e ebighi-ebi.


Ọ̀ nātọm utọ ma-ọli, bú ọnwu nke onye nēmebi iwu? (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta): ọ̀ dighi-atọm utọ mb͕e o si n'uzọ-ya chigharia, we di ndu?


Ha gēkwuputa ajọ omume-ha, na ajọ omume nke ndi bu nna-ha, nime nmekpu-ha nke ha mekpurum, ha gēkwuputa kwa na n'ihi na ha jeghariri n'imegidem,


Obodo isi ndia gāburu umu Israel, buru kwa ọbìa, buru kwa onye bi n'etiti ha, ebe-nb͕abà: ka onye ọ bula nke nētib͕u madu n'ọghọm we b͕alaga n'ebe ahu.


nzukọm gānaputa kwa ob͕u-madu ahu n'aka onye-ọ́bọ̀ ọbara, nzukọm gēme kwa ka ọ laghachi n'obodo nb͕abà ya, ebe ọ b͕alagara: o gēbi kwa nime ya rue mb͕e ọnwu onye-isi-nchu-àjà, nke ewere manu nsọ ahu te.


n'ihi na nime obodo nb͕abà ya ka o gēbi rue mb͕e ọnwu onye-isi-nchu-àjà: ma mb͕e ọnwu onye-isi-nchu-àjà gasiri ob͕u-madu ahu gālaghachi n'ala ihe-onwunwe-ya.


Ha we zigara Ya ndi nēso uzọ-ha, ha na ndi Herod, si, Onye-ozizí, ayi amatawo na I bu onye ezi-okwu, na I nēzí kwa uzọ Chineke n'ezi-okwu, na I dighi-asọ kwa onye ọ bula anya: n'ihi na I dighi-ele madu anya n'iru.


Pita we saghe ọnu-ya, si, N'ezie anamaghọta na Chineke abughi onye nēle madu anya n'iru:


n'ihi na ile-madu-anya-n'iru adighi n'ebe Chineke nọ.


N'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, Ya onwe-ya bu Chineke kachasi chi nile, na Onye-nwenu kachasi ndi-nwenu nile, Chineke uku ahu, bú dike, di kwa egwu, Onye nāhughi madu iru-ọma n'ikpé, Onye nānaraghi ihe-iri-ngo.


Dika ọ bu kwa ihe edebeworo madu ka ha nwua anwu nání otù mb͕e, ma mb͕e nka gasiri ikpé eso ya;


Ọ buru kwa na unu akpọku Ya dika Nna, bú Onye nēkpe ikpé dika ọlu madu nile n'otù n'otù si di nēleghi madu anya n'iru, nēbinu obi n'egwu n'oge unu bi dika ọbìa:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan