Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 14:11 - Bible Nso

11 Nwayi ahu we si, Biko, ka eze cheta Jehova, bú Chineke-gi, ka onye-ọ́bọ̀ ọbara ghara ibibi nke-uku, ka ha we ghara ikpochapu nwam nwoke. Devid we si, Jehova nādi ndu, ọ dighi otù nime agiri-isi nwa-gi gāda n'ala.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Mgbe ahụ ọ zara, “Biko, ka eze kpọkuo aha Onyenwe anyị Chineke ya ka ọ kwụsị onye na-agwa ọchụ, ka ọ ghara igbu onye ọzọ, ka a gharakwa ịla nwa m nwoke nʼiyi.” Ọ sịrị, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, otu agịrị isi agaghị esi nʼisi nwa gị dapụ nʼala.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 14:11
18 Iomraidhean Croise  

Abram we si eze Sọdọm, Eweliwom akam nye Jehova, bú Chineke Nke kachasi ihe nile elu, Onye-nwe elu-igwe na uwa,


Ọ buru na i weda umum ndinyom n'ala, ọ buru kwa na i kuru ndinyom tiyere umum ndinyom, ọ dighi onye ayi na ya nọ; le Chineke bu onye-àmà n'etiti mu na gi.


Eze we si, Onye nāgwa gi okwu, me ka ọ biakutem, ọ gaghi-emetu kwa gi aka ọzọ.


Nwayi ahu we si, Biko, ka nwayi nējere gi ozi gwa onye-nwem, bú eze, okwu. Ọ si, kwue.


Eze we si Joab, Biko, le emewom ihe a: gi je kwa, me ka nwa-okorọbia ahu, bú Absalom, lata.


Solomon we si, Ọ buru na ọ ghọ onye nēme nke-ọma, ọ dighi otù nime agiri-isi-ya gāda n'ala: ma ọ buru na ahuta ihe ọjọ n'aru ya, ọ gānwu kwa.


i gāṅu kwa iyi, Jehova nādi ndu, n'ezi-okwu, na n'ikpé ziri ezi, na n'ezi omume; mba nile gāgọzi kwa onwe-ha nime Ya, ọ bu kwa nime Ya ka ha gānya isi.


Onye-ọ́bọ̀ ọbara, ya onwe-ya gēme ka ob͕u-madu ahu nwua: mb͕e o zutere ya, ya onwe-ya gēme ka ọ nwua.


ma-ọbu asi na o were aka-ya tie ya n'iro, o we nwua; aghaghi ime ka onye nētib͕u ya nwua; ob͕u-madu ka ọ bu: onye-ọ́bọ̀, ọbara gēme ka ob͕u-madu ahu nwua, mb͕e o zutere ya.


onye-ọ́bọ̀ ọbara ewe huta ya n'azu ókè-ala abodo nb͕abà ya, onye-ọ́bọ̀ ọbara ahu we b͕ue ob͕u-madu ahu, ọ dighi ikpe ọbara mara ya:


ma ọbuná agiri-isi nile nke isi-unu ka aguworo.


N'ihi ya ariọm unu ka unu rie nri: n'ihi na nka diri nzọputa-unu: n'ihi na ọ dighi otù agiri-isi gēsi n'isi onye ọ bula n'etiti unu la n'iyì.


Ndi Israel we si Sọl, Jonatan, ọ̀ gānwu, bú onye zọputara nzọputa uku a n'Israel? ya buru ihe-árú: Jehova nādi ndu, ọ dighi otù nime agiri-isi nke isi-ya gādaru ala; n'ihi na ya na Chineke aluwo ọlu ta. Ndi Israel we b͕aputa Jonatan, o we ghara inwu.


Jonatan we si Devid, La n'udo, n'ihi na ayi aṅuwo iyi, ayi abua, n'aha Jehova, si, Jehova gānọ n'etiti mu na gi, na n'etiti nkpurum na nkpuru-gi, rue mb͕e ebighi-ebi. O we bilie, la: Jonatan we ba n'obodo.


Sọl we were Jehova ṅuara ya iyi, si, Jehova nādi ndu, Ahuhu ajọ omume agaghi-ezute gi ma-ọli n'ihe a.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan