Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 13:4 - Bible Nso

4 O we si ya, Gini mere gi onwe-gi nāta aru otú a kwa-ututu, gi nwa eze? ì gaghi-egosim? Amnon we si ya, Tema, bú nwa-nne-nwayi Absalom nwa-nnem, ka mu onwem nāhu n'anya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Otu ụbọchị, Jonadab bịakwutere Amnọn jụọ ya sị, “Gịnị mere, gị bụ nwa eze ji na-ata ahụ ụtụtụ niile? Ọ bụ na ị gaghị akọrọ m?” Amnọn gwara ya sị, “Ahụrụ m Tama nʼanya, bụ nwanne Absalọm, nwanne m nwoke.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 13:4
11 Iomraidhean Croise  

Ma Amnon nwere otù eyì, aha-ya bu Jonadab, nwa Shimea nwa-nne Devid: ma Jonadab bu nwoke mara ihe nke-uku.


Jonadab we si ya, Dinakwasi n'ihe-ndina-gi, me onwe-gi onye aru nādighi ike: ma mb͕e nna-gi batara ihu gi, i gāsi ya, Biko, ka Tema, bú nwa-nnem, bata, ka o me kwa ka m'rie nri, ka o dozi kwa ihe-oriri ahu n'anyam, ka m'we hu ya, rie ya n'aka-ya.


Jezebel, bú nwunye-ya, we biakute ya, gwa ya okwu, si, Gini me-kwa-ra mọ-gi di arọ́, i nērighi kwa nri?


Jezebel, bú nwunye-ya, si ya, Ọ̀ bughi gi onwe-gi bu eze nāchi Israel ub͕u a? bilie, rie nri, ka obi-gi di nma: mu onwem gēnye gi ubi-vine Nebot, bú onye Jezreel.


Nmata ha nāmata iru madu n'ikpe azawo megide ha; nmehie-ha ka ha gosiwo-kwa-ra dika Sọdọm, ha ezobeghi ya. Ahuhu gādiri nkpuru-obi-ha! n'ihi na ha emesowo onwe-ha ihe ọjọ.


ọ̀ di ihere mere ha megbe ha mere ihe-árú? é-è, ihere adighi-eme ha ma-ọli, ọ dighi kwa itiye-n'ọnọdu-ihere ha mara: n'ihi nka ha gāda n'etiti ndi nāda ada: na mb͕e eletara ha ha gāsu ngọngọ, ka Jehova siri.


Ọtọ nwa-nne-gi nwayi, bú nwa nke nna-gi ma-ọbu nwa nke nne-gi, nke amuru n'ulo, ma-ọbu nke amuru n'èzí, ekpughela ọtọ-ha.


Nwoke ọ bula nke nēkuru nwa-nne-ya nwayi, bú nwa-nwayi nna-ya, ma-ọbu nwa-nwayi nne-ya, we hu ọtọ-ya, nwayi ahu we hu ọtọ-ya; ihe-ihere ka ọ bu; agēbipu kwa ha n'anya umu ndi-ha: ọtọ nwa-nne-ya nwayi ka o kpugheworo; o gēbu ajọ omume-ya.


Ọ bu n'elu ihe ọjọ ka ọbu-aka-ha abua di ime ya nke-ọma; onye-isi nāriọ, onye-ikpe ewe jikere n'ihi ugwọ; onye uku kwa, onye nēkwu ihe-ila-n'iyì nke nkpuru-obi-ya ka ọ bu: ha we tukọta ya dika udọ̀.


Atula egwu, ìgwè aturu ntà; n'ihi na ọ di Nna-unu ezi nma inye unu ala-eze-Ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan