Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 13:3 - Bible Nso

3 Ma Amnon nwere otù eyì, aha-ya bu Jonadab, nwa Shimea nwa-nne Devid: ma Jonadab bu nwoke mara ihe nke-uku.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Ma Amnọn nwere otu enyi dị aghụghọ, onye aha ya bụ Jonadab, nwa Shimea, nwanne Devid.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 13:3
21 Iomraidhean Croise  

Ma agwọ di aghughọ kari anu ọhia ọ bula nke Jehova, bú Chineke, mereri. O we si nwayi ahu, Ọ̀ gābu ezie na Chineke siri, Unu erila nkpuru sitere n'osisi ọ bula nke ubi a ab͕ara ogige?


O rue, na mb͕e ahu, na Juda siri n'ebe umu-nne-ya nọ rida, si n'ije-ya wezuga onwe-ya ba n'ulo otù nwoke, bú onye Adulam, onye aha-ya bu Haira.


Juda we zìe nwa-ewu ahu n'aka enyì-ya, bú onye Adulam, inara ihe-ibe ahu n'aka nwayi ahu: ma ọ chọtaghi ya.


O we di Amnon nkpà otú a, na o mere onwe-ya onye aru nādighi ike n'ihi Tema, bú nwa-nne-ya; n'ihi na nwa-ab͕oghọ nāmaghi nwoke ka ọ bu; o we di ike n'anya Amnon ime ya ihe ọ bula.


Jonadab, nwa Shimea nwa-nne Devid, we za, si, Ka onye-nwem ghara isi na emewo ka umu-okorọbia nile, bú umu eze, nwua; n'ihi na Amnon, nání ya, nwuru anwu: n'ihi na edoro nka n'okwu-ọnu Absalom site n'ubọchi o wedara Tema nwa-nne-ya n'ala.


O we si ya, Gini mere gi onwe-gi nāta aru otú a kwa-ututu, gi nwa eze? ì gaghi-egosim? Amnon we si ya, Tema, bú nwa-nne-nwayi Absalom nwa-nnem, ka mu onwem nāhu n'anya.


Joab we ziga ozi na Tekoa, si n'ebe ahu kuta otù nwayi mara ihe, si ya, Biko, me onwe-gi onye nēru újú biko, yiri kwa uwe iru-újú, ete-kwa-la onwe-gi manu, kama di ka nwayi nke nēru újú ọtutu ubọchi ndia n'ihi onye nwuru anwu:


Ọ ta Israel uta, Jonatan nwa Shimai, bú nwa-nne Devid, we tib͕ue ya.


Jesi mua ọkpara-ya, bú Elaiab, na Abinadab, bú nke-abua, na Shimea, bú nke-atọ;


Jonatan nwa-nne nna Devid bu onye nādu ọdu, nwoke nwere nghọta na ode-akwukwọ ka ọ bu: Jehiel nwa Hakmoni nọye-kwa-ra umu-ndikom eze:


Ma Heman jisiri onwe-ya ike, ba n'ulo-ya; o we ziga, me ka ndi nāhu ya n'anya bia, ha na Zeresh, bú nwunye-ya.


Zeresh, bú nwunye-ya, na ndi nile nāhu ya n'anya, we si ya, Ka ha me osisi nke idi-elu-ya di ọgu cubit abua na iri, ma n'ututu gi si eze ka akwuba Mọdekai n'elu-ya: gi so kwa eze ba n'ọṅuṅu-manya-vine ahu nāṅuri ọṅu. Okwu ahu we di nma n'anya Heman; o we me osisi ahu.


Heman we kọrọ Zeresh, bú nwunye-ya, kọ-kwa-ra ndi nile nāhu ya n'anya, ihe nile nke mere ya. Ndi-ya mara ihe na Zeresh, bú nwunye-ya, we si ya, Ọ buru na Mọdekai sitere na nkpuru ndi-Ju, bú onye i maliteworo ida n'iru ya, i gaghi-enwe ike imegide ya, kama i ghaghi ida n'iru ya.


Ọtutu madu nāchọ ime ka iru onye amara aha-ya dajua: Onye ọ bula bu-kwa-ra onye nēnye onyinye eyì.


N'ihi na ndi uche-ha b͕agọrọ ab͕agọ ka ndim bu, Mu ka ha nāmaghi; umu di nzuzu ka ha bu, ndi nādighi-aghọta ihe ka ha bu: ndi mara ihe ka ha bu n'ime ihe ọjọ, ma ime ezi ihe ka ha nāmaghi.


N'ihi na amam-ihe nke uwa nka bu ihe-nzuzu n'ebe Chineke nọ. N'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye nējide ndi mara ihe n'aghughọ-ha:


Amam-ihe a abughi amam-ihe nke nēsi n'elu ridata, kama ọ bu nke uwa, buru kwa nke nkpuru-obi madu nāchi, buru kwa ihe ndi-mọ ọjọ nēzí.


Nwunye Samson we ghọrọ nwoke-ibe Samson nwunye, bú nwoke nke Samson buru ya eyì.


Samuel we si Jesi, Hà agwuwo, bú umu-okoro-gi? Ọ si, Ọ fọdu-kwa-ra ọdudù-nwam, ma, le, ọ nāzù aturu. Samuel we si Jesi, Ziga kuta ya: n'ihi na ayi agaghi-anọdu buruburu rue mb͕e ọ biara n'ebe a.


Jesi we me ka Shama gabiga. Ọ si, Jehova arọputaghi kwa nka.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan