Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 13:19 - Bible Nso

19 Tema we būru ntu n'isi-ya dọwa uwe-nwuda nwere aka nke di n'aru ya; ọ tukwasi aka-ya n'isi-ya, we la, nēje nēti nkpu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 Tama dọwara uwe mwụda ahụ o yi nʼahụ, werekwa ntụ kpokwasị onwe ya nʼisi, buru aka ya nʼisi na-eti mkpu akwa dịka ọ na-ala.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 13:19
10 Iomraidhean Croise  

Reuben we biaghachi n'olùlù ahu; ma, le, Josef anọghi n'olùlù ahu; ọ we dọwa uwe-ya nile.


Devid we jide uwe-ya, dọwa ha; otú a ka ndikom nile ya na ha nọ me-kwa-ra.


o rue, nubọchi nke-atọ, na, le, otù nwoke siri n'ọmuma-ulo-ikwū puta, site n'ebe Sọl nọ, uwe-ya nile dọwara adọwa, ájá dikwasi n'isi-ya: o rue, mb͕e ọ biakutere Devid, na ọ daruru ala, we kpọ isi ala.


Absalom, bú nwa-nne-ya, we si ya, Amnon nwa-nne-gi, ò sorowo gi dina? ma ub͕u a, nwa-nnem, b͕a nkiti: nwa-nne-gi ka ọ bu; atukwasila obi-gi n'ihe a. Tema we nọdu dika nwayi arapuru nání ya, n'ulo Absalom nwa-nne-ya.


Ma Mọdekai mara ihe nile emere, Mọdekai we dọwa uwe-ya nile, yikwasi ákwà-nkpe, kpokwasi ntu n'aru-ya, pua je n'etiti obodo, tie oké nkpu di ilu:


Ha we welie anya-ha site n'ebe di anya, le ya, ma ha amataghi ya, ha we welie olu-ha, kwa ákwá. ha we dọwa, nwoke ọ bula uwe-nwuda-ya, ha we kpokwasi ájá n'isi-ha n'ikpoli ya n'ebe elu-igwe di.


N'ihi nka ka m'nāju onwem aju, we chègharia N'elu ájá na ntu.


Ọbuná n'ala nka ka i gēsi pua, aka-gi abua adi kwa n'isi-gi: n'ihi na Jehova ajuwo ihe-ntukwasi-obi-gi nile, ọ gaghi-aga-kwa-ra gi nke-ọma nime ha.


Joshua we dọwa uwe-nb͕okwasi-ya nile, da kpue iru-ya n'ala n'iru ib͕e Jehova rue anyasi, ya onwe-ya na ndi-okenye Israel; ha we kpokwasi ájá n'isi-ha.


Otù nwoke onye Benjamin we si n'usoro agha ahu b͕a ọsọ, biarue Shailo n'ubọchi ahu, uwe nwuda ya nile dọwara adọwa, ájá dikwasi ya n'isi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan