Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 13:14 - Bible Nso

14 Ma ọ kweghi ige nti olu-ya: ọ di kwa ike kari ya, ọ we weda ya n'ala, soro ya dina.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Ma Amnọn egeghị ntị. Ebe ọ bụ na ọ ka Tama ike, o jidere ya dinaa ya nʼike merụọ ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 13:14
8 Iomraidhean Croise  

Shekem, bú nwa-nwoke Hemoa onye-Haivait, onye-isi ala ahu, we hu ya; o kuru ya, dinayere ya, weda ya n'ala.


Otú a ka Jehova siri, Le, M'nēme ka ihe ọjọ si n'ulo-gi bilie imegide i, M'gāchiri kwa ndinyom-i n'anya-gi nye ibe-gi, ọ gēso kwa ndinyom-i dina n'anya anyanwu a.


Amnon we kpọ ya asì, bú ikpọ-asì di uku ri nne; n'ihi na ikpọ-asì ọ kpọrọ ya di uku kari ihu-n'anya ọ huru. Amnon we si ya, Bilie, la.


Eze we si n'ubi ab͕ara ogige nke ulo-ya biaghachi n'ulo ọṅuṅu manya-vine ahu; ma Heman adawo n'elu ihe-ndina nke Esta nọ n'elu ya. Eze we si, Ọ̀ gēweda kwa nwunye eze n'ala n'irum n'ulom? Mb͕e okwu ahu putara n'ọnu eze, ha kpuchiri iru Heman.


Ọtọ nwa-nne-gi nwayi, bú nwa nke nna-gi ma-ọbu nwa nke nne-gi, nke amuru n'ulo, ma-ọbu nke amuru n'èzí, ekpughela ọtọ-ha.


Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye ya na nwa-nne-ya nwayi nēdina, bú nwa-nwayi nke nna-ya, ma-ọbu nwa-nwayi nke nne-ya. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.


Ndi-nwe Gibea we bilie megidem, b͕a ulo buruburu imegidem n'abali; mu ka ha chère ib͕u, ikom nwayi ka ha weda-kwa-ra n'ala, o we nwua.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan