Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 13:1 - Bible Nso

1 O rue, mb͕e nka gasiri, na Absalom nwa Devid nwere nwa-nne-nwayi mara nma, aha-ya bu Tema; Amnon nwa Devid we hu ya n'anya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Absalọm nwa Devid nwere otu nwanne nwanyị mara mma, aha ya bụ Tama. Ma Amnọn, otu nʼime ụmụ ndị ikom Devid, hụrụ nwaagbọghọ a nʼanya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 13:1
15 Iomraidhean Croise  

Jekob we hu Rechel n'anya; ọ si, M'gēfè gi arọ asa n'ihi Rechel, bú nwa-gi nwayi nke-ntà.


Jekob we fè òfùfè n'ihi Rechel arọ asa; ha di n'anya-ya dika ubọchi ole-na-ole, n'ihi ihu-n'anya o ji hu ya.


Nkpuru obi ya we rapara n'aru Daina nwa-nwayi Jekob, ọ hu nwa-ab͕oghọ ahu n'anya, gwa nwa-ab͕ọghb͕ọ ahu okwu nābà ya n'obi.


na umu-ndikom nke Chineke huru umu-ndinyom nke madu na ha mara nma; ha we lutara onwe-ha ndinyom site na ndi nile ha rọputara.


O rue, na mb͕e anyasi, na Devid siri n'ihe-ndina-ya bilie, jegharia n'elu ulo eze: o we si n'elu ulo ahu hu otù nwayi ka ọ nāsa aru: ma nwayi ahu di nma nke-uku n'ile anya.


Amnon we kpọ ya asì, bú ikpọ-asì di uku ri nne; n'ihi na ikpọ-asì ọ kpọrọ ya di uku kari ihu-n'anya ọ huru. Amnon we si ya, Bilie, la.


O we di Amnon nkpà otú a, na o mere onwe-ya onye aru nādighi ike n'ihi Tema, bú nwa-nne-ya; n'ihi na nwa-ab͕oghọ nāmaghi nwoke ka ọ bu; o we di ike n'anya Amnon ime ya ihe ọ bula.


Ewe muara Absalom umu-ndikom atọ, na otù nwa-nwayi, aha-ya bu Tema: onye ahu bu nwayi mara nma ile anya.


Ma eze, bú Solomon, huru ọtutu ndinyom ala ọzọ n'anya, tiyere nwa-nwayi Fero, ndinyom Moab, ndinyom Amon, ndinyom Edom, ndinyom Zaidon, ndinyom Het;


nke-atọ, Absalom nwa Meaka nwa-nwayi Talmai, bú eze Geshua; nke-anọ, Adonaija nwa Hagit;


Ndia nile bu umu-ndikom Devid, nāgughi umu-ndikom ndi-iko-ya ndinyom; Tema bu nwa-nne-ha nwayi.


Amara bu ugha, ima-nma bu kwa ihe-efu: Ma nwayi nke nātu egwu Jehova, nwayi ahu gēnwe otuto


Achọsila ima-nma-ya ike n'obi-gi; Ekwe-kwa-la ka o were gi na mbubere-anya-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan