Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 12:5 - Bible Nso

5 Iwe Devid we di ọku nke-uku megide nwoke ahu; o we si Netan, Jehova nādi ndu, n'ezie onye kwesiri ọnwu ka nwoke ahu bu nke nēme ihe a:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Devid were oke iwe megide nwoke ahụ, ọ sịrị Netan, “Ana m aṅụ iyi nʼaha Onyenwe anyị dị ndụ na onye mere ihe dị otu a aghaghị ịnwụ!

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 12:5
10 Iomraidhean Croise  

O rue, mb͕e ihe ra ka ọnwa atọ gasiri, na egosiri Juda, si, Tema, bú nwunye nwa-gi, akwawo iko; ọzọ kwa, le, ọ di ime site n'ikwa-iko. Juda we si, Me ka ọ puta, ka esure ya ọku.


Onye-ije we biakute ọgaranya ahu, o we rapu iwere anu n'etiti ìgwè ewu na aturu-ya ma-ọbu n'etiti ìgwè ehi-ya, idoziri onye-ije ahu nke biakutere ya, ma o were nwa-nne-aturu nke ob͕eye, doziere nwoke ahu biakutere ya.


Eze we si nwayi ahu, La n'ulo-gi, mu onwem gēnye kwa iwu bayere gi.


O we chigharia, bara ha nba, si, Unu amataghi aha mọ di nime unu.


N'ihi ya i nweghi ngọpu, gi madu, onye ọ bula nēkpe ikpé: n'ihi na i nāma onwe-gi ikpe n'ihe i nēkpe madu-ibe-gi; n'ihi na gi onye nēkpe ikpe nēme otù ihe ahu.


N'ihi na Jehova nādi ndu, Onye nāzọputa Israel; n'ezie ọ buru na ọ di nime Jonatan nwam, n'ezie ọ ghaghi inwu. Ma ọ dighi onye nāza ya okwu n'etiti ndi Israel nile.


N'ihi na ubọchi nile nwa Jesi di ndu n'elu ala, agaghi-eme ka gi onwe-gi ma-ọbu ala-eze-gi guzosie ike. Ma ub͕u a ziga kutaram ya, n'ihi na onye kwesiri ọnwu ka ọ bu.


Ọ dighi nma, bú ihe a nke i meworo. Jehova nādi ndu, ndi kwesiri ọnwu ka unu bu, n'ihi na unu edebeghi onye-nwe-unu nke-ọma, bú onye Jehova etere manu. Ma ub͕u a, le ebe ube eze di, na ite miri nke di n'akuku isi-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan