O rue, n'ọb͕ub͕a arọ, na mb͕e ndi-eze nāpu ibu agha, na Devid zigara Joab, ya na ndi-orù-ya, na Israel nile; ha we bibie umu Amon, nọchigide kwa Raba n'agha. Ma Devid nānọdu na Jerusalem.
Devid we si onye-ozi ahu, Otú a ka i gāsi Joab, Ka ihe a ghara ijọ njọ n'anya-gi, n'ihi na mma-agha nēripia otù onye dika ọ nēripa onye ọzọ: me ka agha-gi di ike megide obodo ahu, kwadà ya: gi me kwa ka ọ di ike.
(N'ihi na nání Og, bú eze Beshan, ka arapuru site na ndi fọduru nke Refaim; le, ihe-ndina-ya bu ihe-ndina ígwè; ihe-ndina ahu, ọ̀ dighi na Raba nke umu Amon? cubit iteghete ka ogologo-ya di, cubit anọ ka obosara-ya di kwa, dika cubit nke nwoke si di.)