Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 12:25 - Bible Nso

25 O we zìe site n'aka Netan, bú onye-amuma, kpọ aha-ya Jedidaia, n'ihi Jehova.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

25 O zigara ozi site nʼaka Netan, onye amụma, ka a gụọ ya Jedidaya nʼihi Onyenwe anyị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 12:25
14 Iomraidhean Croise  

Devid we kasie Bat-sheba, bú nwunye-ya, obi, we bakuru ya, ya na ya we dina: o we mua nwa-nwoke, Devid we kpọ aha-ya Solomon. Jehova we hu ya n'anya;


Ma Joab busoro Raba nke umu Amon agha, were obodo eze.


O rue, n'abali ahu, na okwu Jehova ruru Netan nti, si,


Netan we gwa Bat-sheba, bú nne Solomon, okwu, si, Ì nughi na Adonaija nwa Hagit aghọwo eze, ma Devid, bú onye-nwe-ayi, amaghi?


Ha we gosi eze, si, Le, Netan, bú onye-amuma. O we bata n'iru eze, kpọ isi ala nye eze, kpuchie iru-ya n'ala.


Ma Zedok, bú onye-nchu àjà, na Benaia nwa Jehoiada, na Netan, bú onye-amuma, na Shimai, na Rei, na ndi-dike ndi Devid nwere, esoghi kwa Adonaija.


Azaraia nwa Netan bu onye-isi nke ndi edoro ndi-isi; Zabud nwa Netan bu onye-isi n'ije ozi na eyì eze;


le, agāmuru gi nwa-nwoke, onye ahu gābu nwoke izu-ike; M'gēme kwa ka o zuru ike pua n'aka ndi-iro-ya nile buruburu: n'ihi na Solomon ka aha-ya gābu, M'gēnye kwa Israel udo na idi-jū n'ubọchi-ya:


Ma ndia ka amuru nye ya nime Jerusalem: Shimea, na Shobab, na Netan, na Solomon, anọ, bú nke Bat-shua nwa-nwayi Amiel:


Ọ̀ bughi n'ihe ndia ka Solomon, bú eze Israel, mehiere? ma n'etiti ọtutu mba ọ dighi eze di ka ya, onye Chineke huru n'anya ka ọ bu kwa, Chineke we me ya eze Israel nile: ọbuná onye ahu ka ndinyom ala ọzọ mere ka o mehie.


Mb͕e ọ kpu okwu n'ọnu, le, igwe-oji nke nēnwu enwu kpuchiri ha: le kwa, olu si n'igwe-oji ahu puta, si, Onye a bu Ọkparam M'huru n'anya, Onye ihe-Ya dim ezi nma; nurunu okwu-Ya.


ma le, olu sitere n'elu-igwe, si, Onye a bu Ọkparam M'huru n'anya, Onye ihe-Ya dim ezi nma.


O kwuru ihe bayere Benjamin, si, Onye Jehova huru n'anya gēbi na ntukwasi-obi n'akuku Ya; O nēkpuchi ya ogologo ubọchi nile, Ọ bu kwa n'etiti ubu-Ya abua ka o nēbi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan