Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 12:20 - Bible Nso

20 Devid we si n'ala bilie, sa aru, te onwe-ya manu, b͕anwe uwe-nb͕okwasi-ya; o we ba n'ulo Jehova, kpọ isi ala: o we ba n'ulo-ya, jua ha, ha we d-oba nri n'iru ya, o rie.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 Mgbe ahụ, Devid sitere nʼala ebe o dina, bilie, saa ahụ, gbanwee uwe ya, baa nʼụlọ Onyenwe anyị, kpọọrọ ya isiala. Ọ lọghachiri nʼụlọ ya nye iwu ka e wetara ya ihe oriri. O rikwara nri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 12:20
20 Iomraidhean Croise  

Devid we hu na ndi-orù-ya nātakwurita onwe-ha, Devid we mata na nwa ahu anwuwo: Devid we si ndi-orù-ya, Nwa ahu, ọ̀ nwuwo? Ha si, Ọ nwuwo.


Ndi-orù-ya we si ya, Gini bu ihe a nke i meworo? ọ bu n'ihi nwa ahu, mb͕e ọ nọ na ndu, ka i būru ọnu, kwa ákwá; ma mb͕e nwa ahu nwuru, i biliri rie nri.


Joab we ziga ozi na Tekoa, si n'ebe ahu kuta otù nwayi mara ihe, si ya, Biko, me onwe-gi onye nēru újú biko, yiri kwa uwe iru-újú, ete-kwa-la onwe-gi manu, kama di ka nwayi nke nēru újú ọtutu ubọchi ndia n'ihi onye nwuru anwu:


Mefiboshet nwa Sọl rida-kwa-ra izute eze; ma o dozighi ukwu-ya, o dozighi kwa afu-ọnu-ya, ọ sughi kwa uwe-ya miri, site n'ubọchi eze jere rue ubọchi mb͕e ọ bia-kwa-ra n'udo.


Ha we bubata ib͕e Jehova, guzo ya n'ọnọdu-ya, n'etiti ulo-ikwū nke Devid mara nye ya: Devid we sure àjà-nsure-ọku na àjà-udo n'iru Jehova.


Eze, bú Devid, we ba, nọdu ala n'iru Jehova; ọ si, Ònye ka m'bu, Onye-nwe-ayi Jehova, gini kwa ka ulom bu, na I mewo ka m'biarue na mb͕e a?


Job we bilie, dọwa uwe-nwuda-ya; kọpu isi-ya, da n'ala, kpọ isi ala;


Ọ si ya, Dika otù nime ndinyom nzuzu si ekwu, otú a ka i nēkwu. Àyi gānara kwa ezi ihe n'aka Chineke, ghara inara ihe ọjọ? Nihe a nile Job ejighi eb͕ub͕ere-onu-ya mehie.


Gọzie Jehova, nkpuru-obim; Ka ihe nile nke di nimem gọzi kwa aha nsọ Ya.


Jehova nwere obi-ebere, nēme kwa amara, Ọ dighi-ewe iwe ọsọsọ, Ọ nāba kwa uba n'ebere.


Aghọrọm onye-ob͕i, adighm-asaghe ọnum; N'ihi na Gi onwe-gi mere ya.


Batanu, ka ayi kpọ isi ala ruru kwa ala; Ka ayi b͕ue ikperè n'ala n'iru Jehova Onye meworo ayi:


Abula onye mara ihe n'anya gi onwe-gi; Tua egwu Jehova, we si n'ihe ọjọ wezuga onwe-gi:


Ka uwe-gi nile di ọcha mb͕e nile; ka manu-otite nke nēsi ísì utọ ghara kwa ikọnari isi-gi.


Ma gi onwe-gi, mb͕e i nēbu ọnu, were manu te n'isi-gi, sa kwa iru-gi;


I weghi manu tem n'isi: ma nwanyi a were manu-otite tem n'ukwu.


Sa kwa aru-gi, te manu n>aru gi, b͕okwasi uwe-nb͕okwasi-gi nile n>aru gi, ridarue ebe-nzọcha-ọka: emela ka nwoke ahu mara gi, rue mb͕e o risiri ihe, @nusi kwa ihe-ọ@nu@nu.


Ma ub͕u a, biko, b͕aghara nmehiem, sorokwam laghachi, ka m'we kpọ isi ala nye Jehova.


Samuel we laghachi soro Sọl n'azu; Sọl we kpọ isi ala nye Jehova.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan