Ma ob͕eye ahu enweghi ihe ọ bula, ma-ọbughi otù nwa-nne-aturu ntà, nke ọ zutara debe ya ndu: o we nọyere ya, nọye-kwa-ra umu-ya, tolite; n'iberibe ihe-oriri-ya ka ọ nēri, n'iko-ya ka ọ nāṅu kwa, n'obi-ya ka o nēdina kwa, o we ghọrọ ya nwa-nwayi.
M'we nye gi ulo onye-nwe-gi, na ndinyom onye-nwe-gi n'obi-gi, nye kwa gi ulo Israel na nke Juda; ma ọ buru na nke ahu di ntà, M'gātukwasi-kwa-ra gi otú a na otú a.
Ihe-nnweta-ya di nnù ewu na aturu iri-na-asa na ọgu iri, na nnù camel asa na ọgu iri, na nnù ehi abua na ọgu iri ejikọrọ abua abua, na nnù nne-inyinya-ibu na ọgu ise, na ndi-orù bara uba nke-uku; nwoke ahu we di uku kari umu Iru-anyanwu nile.