Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 12:17 - Bible Nso

17 Ndi-okenye ulo-ya we bilie n'akuku ya, ime ka o si n'ala bilie: ma o kweghi, o soghi kwa ha ri nri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

17 Emesịa, ndị okenye ụlọ ya rịọrọ Devid ka o bilie rie nri, ma ọ jụrụ iri ihe ọbụla.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 12:17
7 Iomraidhean Croise  

Abraham we si orù-ya, bú okenye nke ulo-ya, onye nāchi ihe nile o nwere, Biko, tiye aka-gi n'okpuru apata-ukwum:


Umu-ya ndikom nile na umu-ya ndinyom nile we bilie ikasi ya obi; ma ọ juru, na agaghi-akasi ya obi; ọ si, N'ihi na m'gāridakuru nwam rue ala-mọ nēru újú. Nna-ya we kwara ya ákwá.


O rue, n'ubọchi nke-asa, na nwa ahu nwuru. Ndi-orù Devid we tua egwu igosi ya na nwa ahu anwuwo: n'ihi na ha siri, Le, mb͕e nwa ahu nọ na ndu, ayi gwara ya okwu, ma o geghi nti n'olu-ayi: àyi gēsi kwa aṅa si ya, Nwa ahu anwuwo, o we me onwe-ya ihe ọjọ?


Ndi ahu nile we bia ime ka Devid rie nri mb͕e ubọchi fọduru; ma Devid ṅuru iyi, si, Chineke mem otú a, me kwa ihe ọzọ otú a, ọ buru na edetum nri ọnu, ma-ọbu ihe ọ bula ọzọ, tutu ọdida-anyanwu.


Etib͕uwo obim dika ihe akuru n'ala, o we kpọnwua; N'ihi na echezọwom iri nrim.


Mb͕e ahu eze lara n'ulo uku ya, nọ ọnọdu-abali nēbu ọnu: achibatakwaghi ubọ egwú n'iru ya: ura-ya fepu-kwa-ra n'anya-ya.


Ma ọ juru aju, si, M'gaghi-eri ihe. Ndi-orù-ya, na nwayi ahu kwa, we rugide ya; o we ge nti olu-ha. O we si n'ala bilie, nọkwasi n'ihe-ndina.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan