Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 11:2 - Bible Nso

2 O rue, na mb͕e anyasi, na Devid siri n'ihe-ndina-ya bilie, jegharia n'elu ulo eze: o we si n'elu ulo ahu hu otù nwayi ka ọ nāsa aru: ma nwayi ahu di nma nke-uku n'ile anya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Nʼotu uhuruchi, Devid sitere nʼihe ndina ya bilie, gagharịa nʼelu ụlọeze ya. Ọ sitere nʼelu ụlọ ahụ hụ otu nwanyị na-asa ahụ. Nwanyị ahụ mara mma nke ukwu nʼile anya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 11:2
28 Iomraidhean Croise  

O rue, mb͕e ọ biaruru nso iba n'Ijipt, na ọ siri Serai, bú nwunye-ya, Biko, le, amaram na nwayi mara nma ile anya ka i bu:


Nwayi we hu na osisi ahu di nma ihe-oriri, na ọ bu kwa ihe nāgu anya agu ile, na ihe anāchọsi ike ka osisi ahu bu kwa ime ka madu nwe uche, o were ufọdu nime nkpuru-ya, rie; o nye kwa di-ya, tinyere onwe-ya, o we rie.


Shekem, bú nwa-nwoke Hemoa onye-Haivait, onye-isi ala ahu, we hu ya; o kuru ya, dinayere ya, weda ya n'ala.


O we rapu ihe nile o nwere n'aka Josef; ọ maghi kwa ihe ọ bula di n'aka ya, ma-ọbughi nání nri nke ya onwe-ya nēri. Josef makwara mma n'aru, ma kwa mma ile anya.


na umu-ndikom nke Chineke huru umu-ndinyom nke madu na ha mara nma; ha we lutara onwe-ha ndinyom site na ndi nile ha rọputara.


O rue, mb͕e nka gasiri, na Absalom nwa Devid nwere nwa-nne-nwayi mara nma, aha-ya bu Tema; Amnon nwa Devid we hu ya n'anya.


Ewe muara Absalom umu-ndikom atọ, na otù nwa-nwayi, aha-ya bu Tema: onye ahu bu nwayi mara nma ile anya.


Umu Rimon onye Beirot, bú Rikab na Beana, we je, biarue ulo Ish-boshet dika n'ikpo-ọku nke ehihie, ma ya onwe-ya nēdina ndina etiti-ehihie.


Ma mb͕e ha batara n'ulo, ka ya onwe-ya nēdina n'ihe-ndina-ya n'ime-ulo-ndina-ya, ha we tib͕ue ya, me ka ọ nwua, wezuga isi-ya, were isi-ya, je ije n'uzọ Araba abali ahu nile.


Mu na anyam abua b͕ara ndu; M'gēsi kwa aṅa lekwasi nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke anya?


Me ka anyam abua si n'ile ihe-efu gabiga, Me ka m'di ndu n'uzọ-Gi nile.


Ume-ngwu nēme ka oké ura dakwasi madu; Ọ bu kwa nkpuru-obi nke di ume-ngwu ka agu nāgu.


Amara bu ugha, ima-nma bu kwa ihe-efu: Ma nwayi nke nātu egwu Jehova, nwayi ahu gēnwe otuto


Achọsila ima-nma-ya ike n'obi-gi; Ekwe-kwa-la ka o were gi na mbubere-anya-ya.


Ka ọ nāgabiga n'amá na nso nkuku nwanyi ahu, Ọ bu kwa n'uzọ ulo-ya ka ọ nāzọ ije;


ulo nile nke Jerusalem na ulo nile ndi-eze Juda, nke ruru árú, gādi kwa ka ebe Tofet, bú ulo nile nke ha sureworo ihe-nsure-ọku nēsì ísì uto n'elu-ha nye usu nile nke ihe elu-igwe, wusi-kwa-ra chi ọzọ di iche iche àjà-ihe-ọṅuṅu.


Okwu M'nāgwa unu n'ọchichiri, kwuenu ya n'ìhè: ihe unu nānu kwa na nti, kwusanu ya n'elu ulo.


onye nọ n'elu ulo, ya ghara iridata ikwapu ihe di n'ulo-ya:


ma Mu onwem si unu, na nwoke ọ bula nke nēle nwanyi anya ka agu ya we gua ya, ọ kwasiwo ya iko n'obi-ya ub͕u a.


Ma n'echi-ya, mb͕e ndi ahu nọ n'ije-ha, nābiaru kwa obodo ahu nso, Pita rigoro n'elu ulo ikpe ekpere, n'ihe ra ka oge hour nke-isi:


Mb͕e i nēwu ulo ọhu, i gēme-kwa-ra elu-ulo-gi ihe-nb͕ochi buruburu, ka i ghara ime ka ọbara di n'ulo-gi, mb͕e madu gēsi na ya da.


Gi enwe-kwa-la anya-uku n'ebe nwunye madu-ibe-gi nọ; agu ulo madu-ibe-gi agu-kwa-la gi, ma-ọbu ubi-ya, ma-ọbu orù-ya nwoke, ma-ọbu orù-ya nwayi, ma-ọbu ehi-ya, ma-ọbu inyinya-ibu-ya, ma-ọbu ihe ọ bula nke madu-ibe-gi nwere.


Ma ọgwugwu ihe nile di nsọ: ya mere nwenu uche zuru okè, nwe-kwa-nu anya-udo ka unu we kpe ekpere:


N'ihi na ihe nile nke di n'uwa, bú agu ihe ọjọ nke anu-aru, na agu ihe ọjọ nke anya, na oké-okwu nke ibi-obi, esiteghi na Nna-ayi, kama o sitere n'uwa.


Ha we si n'ebe di elu ahu rida n'obodo, o we kpayere Sọl uka n'elu-ulo.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan