Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 11:15 - Bible Nso

15 O we de n'akwukwọ ahu, si, Donu Uraia na ncherita-iru agha ahu nke siri ike kari, sinu n'iso ya la azu, ka ewe tib͕ue ya, o we nwua.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Ihe ọ dere nʼakwụkwọ ahụ bụ nke a, “Tinye Ụraya nʼihu agha ebe ọgụ siri ike. Mgbe ndị iro na-apụkwute unu, laanụ azụ, ma hapụnụ Ụraya nʼihu ọgụ ka ndị iro gbuo ya.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 11:15
12 Iomraidhean Croise  

O rue, mb͕e Joab nēche obodo nche, na o tiyere Uraia n'ebe ọ mara na ndikom bu dì-nkpà nọ.


Ndikom obodo we pua, buso Joab agha: ufọdu n'etiti ndi Israel we da, bú n'etiti ndi-orù Devid; Uraia onye Het nwu-kwa-ra.


Gini mere i ji lelì okwu Jehova, ime ihe jọrọ njọ n'anya-Ya? i werewo mma-agha tib͕ue Uraia onye Het, nwunye-ya ka i werewo-kwa-ra n'onwe-gi na nwunye; ma ya onwe-ya, i werewo mma-agha umu Amon b͕ue ya.


n'ihi na Devid mere ihe ziri ezi n'anya Jehova, o sighi kwa n'ihe ọ bula O nyere ya n'iwu wezuga onwe-ya ubọchi nile nke ndu-ya, ọ bu nání n'okwu Uraia onye Het.


Naputam n'aka ikpe-ọmuma ọbara di iche iche, Chineke, bú Chineke nke nzọputam; Irem gēti nkpu ọṅù bayere ezi omume-Gi.


Megide Gi, nání Gi, ka m'mehieworo, Ọ bu kwa ihe jọrọ njọ n'anya-Gi ka m'meworo: Ka I we buru onye ezi omume mb͕e I nēkwu okwu, Di kwa ọcha n'obi mb͕e I nēkpe ikpe.


N'ihi na emeghi ihe ekpere n'ikpe megide ọlu ọjọ ọsọsọ, n'ihi nka obi umu madu juru eju nime ha ime ihe ọjọ.


Obi di aghughọ kari ihe nile, ihe nādighi ngwọta ka ọ bu kwa: ònye gāmara ya?


Bùkuenu Jehova abù, tonu Jehova: n'ihi na Ọ naputawo nkpuru-obi nke ob͕eye n'aka ndi nēme ihe ọjọ.


Sọl we si Devid, Le, adam, bú Mirab, ya ka m'gēnye gi na nwunye: nání burum dìnkpà, bū kwa agha nile nke Jehova. N'ihi na Sọl siri, Ka akam ghara idi n'aru ya, kama ka aka ndi Filistia di n'aru ya.


Sọl we si, M'gēnye ya ya, ka o we ghọrọ ya ọnyà, ka aka ndi Filistia we di n'aru ya. Sọl we si Devid, Nke ub͕ò abua ka i gāburum di nwam ta.


Sọl we si, Otú a ka unu gāsi Devid, Ọ dighi ego-ilu-nwunye gātọ eze utọ, kama ọgu api ise nke ndi Filistia, ka o we bọrọ onwe-ya ọ́bọ̀ n'aru ndi-iro eze. Ma Sọl chère ime ka Devid da ada n'aka ndi Filistia.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan