Ma Elaisha nāria ọria nke ọria-ya ahu nke ọ nwuru nime ya: Joash, bú eze Israel, we ridakuru ya, kwa ákwá n'iru ya, si, Nnam, nnam, ub͕ọ-ala Israel, na ndi-inyinya-ya!
Ma Elaisha nēle ya anya; ya onwe-ya nēti kwa nkpu, si, Nnam, nnam, ub͕ọ-ala Israel, na ndi-inyinya-ya! ma ọ hughi ya ọzọ: o we jide uwe nke aka ya, dọwa ha ibe abua.